Igbo Mass Readings for February 7 2024, Wenezde n’ime Izuụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 7 2024, Wenezde n’ime Izuụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 10:1-10

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ Ndịeze nke mbụ

Mgbe eze nwaanyị Sheba nụrụ ọtụtụ akụkọ gbasara Solomọn, ya abịa ịjụ Solomọn ajụjụ siri ike iji mata ma ihe ọ nụrụ ọ bụkwa eziokwu. Ọ kpọọrọ ọtụtụ ndị na-eso ya bịa. Ha dukwa ọtụtụ ịnyịnyaibu bịa, ịnyịnyaibu ndị a bụ ude dị icheiche burukwa nnukwute ọlaedo, na nkume ndị dị oke ọnụ na ihe na-esi isiọma.

Mgbee ọ bịakwutere Solomọn, o kwupụtara ihe niile o bu n’uche bịa. Solomọn zachara ajụjụ niile ọjụrụ ya zaruo ala. O nweghị ajụjụ ọbụla nke gbara ya gharịị.

Mgbe ezenwanyị nke Sheba hụchara ka oke amamihe Solomọn dị, hụ ụlọ eze o wuru, nri e dotere n’elu oche nri, ebee ndịọrụ ya bi, ka ụmụodibo ya si ejere ya ozi, uwe ụmụodibo ya yi n’ahụ, ndị na-eburu ya iko ihe ọñụñụ, na aja nsureọkụ nke ọ chụrụ n’ụlọnsọ Yahweh, o nwekwaghị ọnụ okwu.

Ezenwaanyị a ewee gwa Solomọn sị, “Ihe niile m nụrụ n’ala m gbasara gị na amamihe gị bụ eziokwu. Ma ekwetaghị m ruo mgbe m jiri anya m n’eziokwu hụ, akụkọ m nụrụ erughị ọkara ihe m hụrụ. Amamihe I nwere na ụba ị bara kariri ka m siri nụ n’akụkọ.

Ndịnwunye gị nwere isiọma, ụmụodibo gị nwekwara isiọma, ndị nọ n’ihu gị oge niile na-anụ okwu amamihe gị. Ngọzi dịrị Yahweh Chineke gị onye nwere mmasị n’ebe ị nọ wee dote gị n’ocheeze nke Izrel!

Ọ bụ maka na Chineke hụrụ Izrel n’anya ka o jiri chie gị eze ka i were ikpe nkwụmọtọ na ụzọ ziri ezi na-achị.” E mechaa o nye eze Solomọn ọlaedo dị puku kilogram anọ, nyekwa ya nnukwu ụda dị icheiche ya na okwute dị oke ọnụ.

O nwebeghịkwa mgbe ụda ha ka nke a ezenwaanyị Sheba jiri bịa rutere Solomọn aka ọzọ.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 37: 5-6, 30-31, 39-40

Azịza: Ọnụ onye eziomume na-ekwupụta amamihe.

1. Were ndụ gị nye Onyenweanyị n’aka

tụkwasa obi na ya, ka O nyere gị aka.

Ọ ga-eme ka eziomume gị na-amụkesị dịka ihe,

mee kwa ka eziokwu gị na-acha dịka ehihie. Azịza

2. Ọnụ onye eziomume na-ekwu amamihe,

ire ya na-ekwupụtakwa ikpe nkwụmọtọ;

Ebe iwu Chineke dị n’ime obi ya,

ọ gaghị azọhie ụkwụ. Azịza

3. Nzọpụta nke ndị eziomume na-esi n’aka Onyenweanyị abịa,

Ọ na-echekwaba ha n’oge nsogbu;

Onyenweanyị na-enyere ha aka, na azọpụtakwa ha.

Ọ na-azọpụta ha n’ihina ọ bụ onye nchedo ha. Azịza

MBEKU – Ps. 25:4,5

Alleluia, Alleluia:

Onyenweanyị, mee ka m mata ụzọ gị, dube m n’ụzọ eziokwu gị.

Alleluia.

OZIỌMA – 7:14-23

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Jesu kpọrọ igwe mmadụ ahụ ọzọ ka ha bịakwute ya. Ọ sịrị ha, “Geenụ m ntị, ụnụ niile, ghọtakwanụ ihe m ga-ekwu! O nweghị ihe ọbụla si n’ọnụ banye n’ime mmadụ na-emerụ ya. Kama ọ bụ ihe si n’ime mmadụ pụta bụ ihe na-emerụ mmadụ.

Onye nwere ntị ya nụrụ”. Mgbe Jesu hapụrụ igwe mmadụ ahụ banye n’ụlọ, ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya ihe okwu a pụtara. Ọ jụrụ sị, “Ọ bụ na ụnụ enwekwaghị nghọta?

Ọ pụtara na ụnụ amaghị na ihe ọbụla si n’ọnụ banye n’ime mmadụ apụghị imerụ ya. N’ihina ihe oriri adịghị abanye n’obi mmadụ kama n’afọ.

Ọ na-esikwa ebe ahụ pụọ”. Site n’ikwu otu a, o mere ka ihe oriri niile dị ọcha. O kwukwara sị, “Ihe na-emerụ mmadụ bụ ihe si n’ime mmadụ pụta.

N’ihina site n’ime mmadụ, ya bụ site n’ime obi, ka echiche ọjọọ nke na-eduba mmadụ n’omume rụrụ arụ, si apụta, ya na ịkwaiko na izu ohi niile na igbu mmaduụ na ịkpọrọ nwunye mmadụ mọbụ di mmadụ, obi ọjọọ na arụrụala, nghọgbu, asọghị anya na ịkwaiko, anya ụfụ, nkwulu, mpako, enweghị uche ime ihe ziri ezi na ịghọta ihe nke mmụọ. Omume ọjọọ ndị a na-esi n’ime mmadụ apụta. Ọ bụ ha na-emerụ mmadụ”.

Igbo Mass Readings for February 8 2024, Tọọzde n’ime Izuụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for February 7 2024, Wenezde n’ime Izuụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 7, 2022