Igbo Mass Readings for February 15 2023, Wednezde n’ime Izuụka nke Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 15 2023, Wednezde n’ime Izuụka nke Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 8:6-13, 20-22
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Jenesis
Ka iri ụbọchị anọ gachara Noa mepere mpioikuku ụgbọ ahụ ọ rụrụ. O zipụ otu ugolọma nke nọ na-efegharị, ruo mgbe mmiri tachara n’elu ụwa. O zipụ otu nduru iji chọpụta ma mmiri ọ ka nọ n’elu ụwa.
Ma nduru ahụ, ahụghị ebe ọ ga-ebere, ọ lọkwute ya n’ime ụgbọ ahụ, n’ihina mmiri jupụtara n’elu ụwa niile. O wepụtara aka ya jide ya ma weghachi ya azụ n’ime ụgbọ ahụ.
Ka abalị asaa gachakwara, o si n’ụgbọ ahụ zipụ nduru ahụ ọzọ. Na mgbede, nduru ahụ ewere lọghachikwute ya kpụruụ akwụkwọ ndụ nke oliv n’ọnụ ya.
Nke a mere Noa ji mata na mmiri atachala n’elu ụwa. Ka ụbọchị asaa ọzọ gara, o zipụkwara nduru ahụ ọzọ, ma nduru ahụ alọghachikwuteghị ya ọzọ.
Ọ bụ n’ime narị afọ isii, n’afọ mbụ nke ndụ Noa, n’ime ọnwa mbụ n’ụbọchị mbụ nke ọnwa ahụ, ka mmiri ahụ bidoro tachapụwa n’ụwa. Noa ewere meghee ọnụụzọ ụgbọ ahụ lepụ anya, hụ na elu ala agbakọchaala.
Mgbe ahụ Noa rụụrụ Yahweh ebe nchụaja, o were ụmụ anụmaanụ na ụmụnnụnụ niile na-emerụghị emerụ chụọ aja nsureọkụ n’ebe nchụaja ahụ.
Mgbe Yahweh nụrụ isi aja nsureọkụ ahụ, Yahweh ekwuo n’ime obi ya sị, “Mgbe ọzọ agaghị m abụ ụwa ọnụ n’ihi ụmụ mmadụ, n’ihina obi ha na-achọ ihe ọjọọ site na mgbe ha dị na nwata.
O nweghị mgbe ọzọ m ga-egbukwa ihe niile dị ndụ dịka m siri mee. Oge niile ụwa ga-adị site ugbu a gaa n’ihu, oge ịkụ ihe na ịghọta ihe ubi, oge oyi ụtụtụ na ekpomọkụ, udu mmiri na ọkọchị, abalị na ehihie agaghị akwụsị ịdị.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 116:12-13, 14-15, 18-19
Azịza: Aga m achụrụ gị aja ekele, wee kpọkue aha nke Onyenweanyị
1. Kedụ ihe m ga-enye Onyenweanyị?
Maka ihe ọma niile o meere m,
Aga m ebuli iko nzọpụta,
wee kpọkue aha nke Onyenweanyị. Azịza
2. Aga m emejupụta nkwa m kwere Onyenweanyị,
n’ihu ndị nke ya niile.
Ọnwụ onye eziomume dị oke ọnụ
N’ebe Onyenweanyị nọ. Azịza
3. Aga m emejupụta nkwa m kwere Onyenweanyị,
n’ihu ndị nke ya niile.
N’ogige ụlọ nke Onyenweanyị,
n’etiti gị Jerusalem. Azịza
MBEKU – Ps. 19:9
Alleluia, Alleluia:
Iwu nke Onyenweanyị kwụ ọtọ, ọ na-enye obi añụrị; Iwu nke Onyenweanyị pụtara ihe; ọ bụ ihe e ji ahụ ụzọ.
Alleluia.
OZIỌMA – 8:22-26
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Mgbe Jesu na ndị na-eso ụzọ ya bịarutere na Betsaịda, ụfọdụ ndị mmadụ kpọtaara Jesu otu onyeisi, rịọ ya ka o metụ ya aka. O sekpụụrụ onyeisi ahụ n’aka dupụta ya n’obodo nta ahụ.
Jesu bụnyere asụ n’anya abụọ nke onyeisi ahụ, bikwasakwa ya aka ya abụọ, ọ jụọ ya, sị, “O nwere ihe ị hụrụ? Nwoke ahụ leliri anya elu, sị, “Ana m ahụ ndị mmadụ ma ha na agagharị dịka osisi na-aga ije.”
Jesu bikwasakwara aka ya abụọ n’anya nwoke ahụ ọzọ. Nwoke ahụ legidesiri anya ike, anya ya dịkwa mma ọzọ; o were hụchaa ihe niile nke ọma. Jesu zilara ya ụlọ, sị ya, “Abanyekwala ọ bụladị n’ime obodo ntakịrị a.
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.