Igbo Mass Readings for February 16 2028, Wednezde n’ime Izuụka nke Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 16 2028, Wednezde n’ime Izuụka nke Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:19-27
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọozi Jemis
Maranụ nke a ụmụnna m hụrụ n’anya! Ka onye ọbụla jisie ike na-anụ ihe ngwangwa. Ma onye ọbụla emekwala ngwa n’ikwu ihe ọ nụrụ, mọbụ n’iwe iwe. N’ihina iwe anaghị ekwe mmadụ rụọ ọrụ eziomume Chineke.
Ya bụ hapụnụ omume niile rụrụ unyi na omume obi ọjọọ niile na ihe juru ụnụ n’ahụ. Werenụ nwaayọ nara okwu ahụ nke a kụrụla n’obi ụnụ dịka mkpụrụ nke pụrụ ịzọpụta mkpụrụobi ụnụ.
Ma bụrụnụ ndị na-eme okwu ahụ eme. Ụnụ abụkwala ndị na-anụ naanị ọnụnụ. Ndị dị otu a na-arafu onwe ha. Onye na-anụ okwu ahụ naanị ọnụnụ ma ọ naghị eme ya eme dị ka onye na-ekiri ihu ya otu chi si kee ya n’enyo.
Ọ na-ekiricha onwe ya pụọ chefuo ngwangwa otu ihu ya dị. Ma onye nyochara nke ọma n’ime iwu ahụ zuru oke nke na-eme ka mmadụ nwere onwe ya onye na-anọgidekwa n’ime ya ghara ịbụ naanị onye na anụ sọ ọnụnụ ọnụnụ wee chefuo kama onye na-eme ya eme Chineke ga-agọzi onye ahụ n’ihe niile ọ na-eme.
Ọ bụrụ na onye ọbụla na-eche na ya bụ onye na-ekpere Chineke ma hapụ ijide ire ya aka mọbụ kwaa ire ya nga onye ahụ na-arafu onwe ya, Okpukpe Chineke nke onye dị otu a bụkwa ihe efu.
Okpukpe Chineke nke dị ọcha nke na-emerụghị emerụ n’anya Chineke Nna bụ nke a: ileta ụmụ ogbenye na ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ n’ime mkpagbu ha. Ọ bụkwa mmadụ idobe onwe ya n’enweghị ntụpọ site n’aka ndị ụwa.
ABỤOMA NA AZỊZA – Ps. 15:2-3, 3-4, 5
Azịza: Onye eziomume ga-ebi n’ugwu nsọ nke Onyenweanyị
1. Ọ bụ nwoke ahụ na-ebughị njọ ọbụla na ndụ ya,
onye na-eme ihe dị mma,
onye ji obi ya niile ekwu eziokwu.
Onye na-anaghị ekwutọ ndịọzọ. Azịza
2. Onye anaghị eme onye agbataobi ya ihe ọjọọ;
Mọbụ bo ya ebubo asị.
Onye na-eleda ndị amaghị Chineke anya
ma na-enye ndị na-atụ Yahweh egwu nsọpụrụ. Aziza
3. Onye na-ebinye ego n’anaghị ọmụrụ nwa,
onye anaghị eri ngarị iji megide onye enweghị ihe ọjọọ o mere.
Ọ bụrụ na mmadụ e mee ihe ndị a
O nweghị ihe ọbụla ga-eme ka egwu tụọ ya. Azịza
MBEKU – Ps. 19:9
Alleluia, Alleluia:
Iwu nke Onyenweanyị kwụ ọtọ, ọ na-enye obi añụrị; Iwu nke Onyenweanyị pụtara ihe; ọ bụ ihe e ji ahụ ụzọ.
Alleluia.
OZIỌMA – 8:22-26
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Mgbe Jesu na ndị na-eso ụzọ ya bịarutere na Betsaịda, ụfọdụ ndị mmadụ kpọtaara Jesu otu onyeisi, rịọ ya ka o metụ ya aka. O sekpụụrụ onyeisi ahụ n’aka dupụta ya n’obodo nta ahụ.
Jesu bụnyere asụ n’anya abụọ nke onyeisi ahụ, bikwasakwa ya aka ya abụọ, ọ jụọ ya, sị, “O nwere ihe ị hụrụ? Nwoke ahụ leliri anya elu, sị, “Ana m ahụ ndị mmadụ ma ha na agagharị dịka osisi na-aga ije.”
Jesu bikwasakwara aka ya abụọ n’anya nwoke ahụ ọzọ. Nwoke ahụ legidesiri anya ike, anya ya dịkwa mma ọzọ; o were hụchaa ihe niile nke ọma. Jesu zilara ya ụlọ, sị ya, “Abanyekwala ọ bụladị n’ime obodo ntakịrị a.
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.