Igbo Mass Readings for June 2 2027, Wednezde n’ime Izuụka nke Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 2 2027, Wednezde n’ime Izuụka nke Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:1-11, 16

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Tobit

Site na mwute m, ebere m akwa ma kpee ekpere sị: “O Dinwenụ, ị bụ Onye eziomume; ọrụ gị na ụzọ gị niile dị ebeebe. Cheta m O Dinwenụ, lekwasa m anya ebere gị. Atala m ahụhụ dịka njọ m na mmehie m na nke nna m ha mere n’ihu gị siri dị.

N’ihina ha nupụrụ isi n’iwu gị nke mere i ji mee ka anyị bụrụ ndị a lara n’iyi, ndị a dọkpụrụ n’agha ma nyefee anyị n’aka ọnwụ. I meela ka anyị bụrụ ihe nkọcha na mba niile ndị a chụsasịrị anyị n’etiti ha.

Ma ugbu a i gosịpụtala ikpe nkwụmọtọ gị site n’ịta m ahụhụ maka mmehie m na nke nna m ha n’ihina anyị edobeghị iwu gị, nke anyị na-aga n’ụzọ eziokwu gị. Dinwenụ mee m ka o siri masị gị, were ndụ m ka m laghachi bụrụ ntụ.

Ọ kaara m mma ịnwụ karịa ịdị ndụ n’ihina anatala m ọtụtụ mkparị asị, enyekwala m oke iru ụjụ nke obi. Ugbu a mee ka a tọhapụ m na nsogbu m ka m gaa n’ebe obibi dị ebeebe: ewepụkwala ihu gị n’ebe m nụ.

N’otu ụbọchị ahụ n’Ekbatana dị na Midia ụmụodibo nwaanyị nna Sara ada Raguel kparịrị ya, n’ihina ọ lụọla dị asaa, ndị nke ajọ mmụọ Asmọdeus gburu onye ọbụla n’ime ha tupu ha enwee mmekọ dịka di na nwunye.

Nke a mere ụmụodibo a ji akọ ya ọnụ sị, “Ọ bụ na ị maghị na ọ bụ gị na ahịgbu ndị di gị? I nweela di asaa mana o nweghị nke ọbụla i ritere uru n’aka ya. Gịnị mere i ji eti anyị ihe?

Ọ bụrụ na ndị di gị anwụọla soro ha gaba! Ka anya anyị ghara ịhụ nwa gị ọbụla”. Mgbe ọ nụrụ okwu ndị a o wutere ya nke ukwuu nke na o chere echiche ịkwụ ụdọ.

Mana o kwuru sị, “Ọ bụ sọ m bụ nwa nna m mụrụ: Ọ bụrụ na m mee nke a, aga m ebutere nna m ihe ihere ma mekwaa ka o were iru ụjụ laa mmụọ n’agadi”.

O kpere ekpere n’akụkụ mpioikuku ya sị: “Ngọzi dịrị gị, O Dinwenụ Chineke m, ngọzi dịkwara aha gị dị nsọ kwesịrị nsọpụrụ ebeebe. Ka aka ọrụ gị niile too gị ebeebe. A nụrụ ekpere ha abụọ n’ihu ebube Chineke dị ukwuu. E zipụrụ mmụọọma Rafel ka ọ gwọọ ha abụọ.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 25:2-4,4-5,6-7,8-9

Azịza: Onyenweanyị, n’ebe ị nọ ka m welitere mmụọ m elu.

1. Chineke m, na gị ka m tụkwasịrịobi,

ekwekwala ka ihere mee m,

ekwekwala ka ndịiro m merie m.

Mọbụ ka ihere mee ndị chekwubere na gị,

kama ka ihere mee ndị obi ọjọọ.

Azịza: Onyenweanyị, n’ebe ị nọ ka m welitere mmụọ m elu.

2. Mee ka m mata ụzọ gị, Onyenweanyị,

kụziere m ụzọ gị

Dube m n’ụzọ eziokwu gị, ma kuzibere m,

n’ihina ọ bụ gị bụ Chineke onye nzọpụta m.

Azịza: Onyenweanyị, n’ebe ị nọ ka m welitere mmụọ m elu.

3. Cheta ebere gị, O Onyenweanyị,

chetakwa ịhụnaanya gị na-enweghị ube

nke i gosịrị site na mgbe ochie.

cheta m n’ịhụnaanya gị,

n’ihi ịdị mma gị, Onyenweanyị.

Azịza: Onyenweanyị, n’ebe ị nọ ka m welitere mmụọ m elu.

4. Onyenweanyị dị mma, bụrụkwa onye eziomume,

Ọ na-akụziri ndị mmehie ụzọ

Ọ na-eduzi ndị umela n’ihe niile kwụ ọtọ

Ọ na-akụziri ndị ogbenye ụzọ ya.

Azịza: Onyenweanyị, n’ebe ị nọ ka m welitere mmụọ m elu.

MBEKU – Ps. 111:8

Alleluia, Alleluia:

Iwu nke Onyenweanyị dị ntụkwasịobi n’ụzọ niile, nke a mere ka ọ dị ebeebe ebeebe.

Alleluia.

OZIỌMA – 12:18-27

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Ụfọdụ ndị Sadụsii ndị na-ekweghị na mbilite n’ọnwụ, bịakwutere Jesu jụọ ya sị, “Onyenkuzi, Mosis denyere anyị iwu, na ọ bụrụ na mmadụ anwụọ hapụ nwunye ya na-amụtaghị nwa, na nwanne ya nwoke ga-ekuchi nwunye ya ahụ were mụta ụmụ n’aha nwanne ya ahụ nwụrụ anwụ.

O nwere ụmụnne asaa dịnụ, onye nke mbụ n’ime ha lụrụ nwaanyị, nwụọ n’amụtaghị nwa. Nke abụọ kuchiri nwunye ya a. E mechaa ọ nwụọkwa n’amụtaghị nwa. Otu ihe ahụ mekwara nwanne ya nke atọ.

Ụmụnne asaa ndị a lụchara nwaanyị a ma o nweghị nke mụtara nwa. N’ikpeazụ nwaanyị ahụ n’onwe ya nwụkwara. Na mbilite n’ọnwụ, nwunye onye ka ọ ga-abụ, n’ihina ụmụnne asaa ndị a lụchara ya?”

Jesu zara ha sị, “Ọ bụ na ọ bụghị ihe a ka ụnụ ji ejehie ụzọ, ụnụ amaghị Akwụkwọ Nsọ nke ụnụ na-ama ike nke Chukwu?

N’ihina mgbe ha ga-ebilite n’ọnwụ, ha agaghịkwa alụ di na nwunye, ha ga-adị ka ndị mmụọọma nke eluigwe.

Maka mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, ọ bụ na ụnụ agụtabeghị n’Akwụkwọ nke Mosis ebe e dere banyere ọhịa ahụ otu Chineke si gwa ya okwu sị, “Abụ m Chineke nke Abraham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb. Ụnụ na-ejehie ụzọ n’ihi na ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ kama ọ bụ Chineke nke ndị dị ndụ”.

Igbo Mass Readings for June 3 2027, Tọọzde n’ime Izuụka nke Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for June 2 2027, Wednezde n’ime Izuụka nke Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.