Igbo Mass Readings for January 8 2025, Wenezde na-eso Ụka Epifani
Nke a bụ Igbo Mass Readings maka January 8 2025, Wenezde na-eso Ụka Epifani.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:11-18
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi mbụ nke Jọn
Ndị m hụrụ n’anya, ebe ọ bụ na Chineke hụrụ anyị n’anya otu a, anyị kwesịkwara ịhụrịta onwe anyị n’anya. O nwebeghị onye hụrụla Chineke. Ọ bụrụ na anyị hụrịta onwe anyị n’anya, Chineke na-anọgide n’ime anyị, ma na-emekwa ka ịhụnaanya ya zuo oke n’ime anyị.
Otu a ka anyị ga-esi mara na anyị bi n’ime ya, ya onwe ya ebiri n’ime anyị n’ihi na o nyela anyị Mmụọ ya. Anyị ahụla, na-agbakwa akaebe na Nna ezitela Nwa ya ka ọ bụrụ onye nzọpụta nke ụwa.
Onye ọbụla na-ekwupụta na Jesu bụ Nwa Chineke, Chineke na-ebi n’ime ya, ya onwe ya na-ebikwa n’ime Chineke. Anyị maara, ma kwerekwa n’ịhụnaanya Chineke nwere n’ebe anyị nọ. Chineke bụ ịhụnaanya, onye ọbụla na-anọgide n’ịhụnaanya na-anọgide na Chineke, Chineke na-anọgidekwa n’ime ya.
Otu a ka e si mee ka ịhụnaanya zuo oke n’ebe anyị nọ, na anyị ga-enwe obi siri ike n’ụbọchị ikpe ahụ, n’ihi na otu ọ dị, ka anyị onwe anyị dịkwa n’ụwaa.
Ụjọ adịghị n’ịhụnaanya. Ịhụnaanya zuru oke na-achụpụ egwu. N’ihina ụjọ na ntaramaahụhụ na-agakọ. Onye ọbụla na-atụ egwu, ezubeghị oke n’ịhụnaanya.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 72:1-2, 10, 12-13.
Azịza: Onyenweanyị mba niile dị n’ụwa ga-esekpuru gị.
1. Nye eze ikpe nkwụmọtọ gị, O Chineke,
nyekwa nwa eze eziomume nke gị,
Ka o were nwee ike ịchị ndị nke gị n’ụzọ ziri ezi,
nyekwa ndị ogbenye ikpe ziri ezi. Azịza
2. Eze ndị Tashish na eze obodo mmiri gbara gburugburu ga-efe ya.
Eze ndị Sheba na Seba ga-enye ya onyinye. Azịza
3. Ọ ga-atọhapụ onye ogbenye kpọkuru ya,
na ndị niile chọrọ enyemaka ya.
Ọ ga-emere ndị ogbenye na ndị esighị ike ebere,
na-azọkwa ndụ ndị nọ na mkpa. Azịza
MBEKU
ALLELUIA ALLELUIA:
E kwusara ya na mba niile, Onye ụwa niile kwere na ya, E buliri ya elu n’otito.
ALLELUIA.
OZIỌMA – 6:45-52.
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Mgbe puku mmadụ ise ahụ rijuchara afọ, ngwangwa Jesu mere ka ndị na-eso ụzọ ya banye n’ụgbọ mmiri, buru ya ụzọ kwofee n’ofe nke ọzọ nke osimiri Betsaịda, ma ya onwe ya nọdụrụ izila igwe mmadụ ahụ.
Mgbe ọ hapụrụ ha ọ gara n’elu ugwu ikpe ekpere. N’oge uhuruchi ndị na-eso ụzọ ya nọ n’ụgbọ mmiri n’etiti osimiri, ma Jesu nọ n’ala naanị ya. Mgbe ọ hụrụ na ndị na-eso ụzọ ya na-adọgbu onwe ha n’ịnya ụgbọ n’ihi na ifufe na-efegide ha.
N’ihe dịka elekere anọ nke ụtụtụ ọ bịakwutere ha, na-aga ije n’elu mmiri. O wee chọọ ịgafe ha, ma mgbe ha hụrụ ya ka ọ na-aga ije n’elu mmiri, ha chere na ọ bụ mmụọ, wee tie mkpu.
Ha niile hụrụ ya, obi wee fepụ ha. Ma ngwa-ngwa Jesu sịrị ha, “Obi sie ụnụ ike, ọ bụ m ụnụ atụla ụjọ!” O wee banyekwuru ha n’ụgbọ mmiri, ifufe wee kwụsị.
Ihe ndị a gbagwojuru ndị na-eso ụzọ ya anya. N’ihi na ha aghọtaghị ihe banyere ogbe achịcha ise ahụ o ji zụọ igwe mmadụ maka na obi ha kpọchiri akpọchi.
Igbo Mass readings for January 9 2025, Tọọzde na-eso Ụka Epifani.
Igbo Mass Readings for January 8 2025, Wenezde na-eso Ụka Epifani.