Ekpere maka ibuso iri Awufu na ime Wuruwuru agha na Naijiria

Here is Ekpere maka ibuso iri Awufu na ime Wuruwuru agha na Naijiria said by Catholic faithful asking God for His divine assistance in the fight against bribery and corruption in Nigeria.

Ekpere maka ibuso iri Awufu na ime Wuruwuru agha na Naijiria

Nna bi n’igwe Ị na-azụ ihe nile I kere eke mgbe nile iji mee ka ha niile na-adị ndụ etu I siri chọọ. I jiri ụba dị na mmadụ na akụ na ụba dị n’ime ụwa gọzie ala anyị bụ Naịjiria ka ewere ha na-asọpụrụ, na-eto Gị jirikwa ha na-ewetara onye Naịjiria ọbụla ọdịmma.

Ọ na-ewute anyị nke ukwuu n’anyị ji onyinye Gị na ngọzi Gị ndị a na-eme inyo site na mmegide dị iche iche, iri awufu na ime wuru-wuru.

Omume ọjọọ ndị a kpatara ọtụtụ ndị ala anyị iiri nọrọ n’ezigbo agụụ, ọrịa, ìsì na oke nleghara anya. Chineke Nna anyị sọ Gị nwere ike ịgwọta anyị na ala anyị bụ Naịjiria ọrịa ọjọọ nke a.

Anyị na-arịọ Gị, biko metụ ndụ anyị aka, metụkwa ndụ ndị na-achị anyị na ndị ala anyị aka, ka anyị niile nwe ike ịghọta ụdị arụ iri-awufu na ime wuru-wuru bụ; were gbaa mbọ ikpochapụ ya.

Zụlitere anyị ndị na-atụrụ Chukwu egwu na ndị ndu ga-elezi anyị anya, na-edu anyị n’ụzọ nke udo, ezi ụba na ọganihu. Anyị na-arịọ Gị nke a site na Jesu Kristi, Dinwenụ anyị. Amen.

Obi Jesu Kacha Nsọ

Meere Anyị Ebere. (Ugboro Atọ)

Other Catholic Prayers

Categorized in:

Catholic Prayers,