Igbo Hymns for Stations of the Cross

Here are Igbo Hymns for Stations of the Cross which are sung by Catholic faithful within the 14 stations of the cross.

Igbo Hymns for Stations of the Cross

ENTRANCE:

Onye mmehie kulie, chegharịa chọba Chineke gị, mgbe ọ ka nọ nso, chọbakwa ya mgbe ọ ka ga-ekwe nchọta oge dị nwa nke-nke.

OR:

O Chineke gbaghara, mee ebere Nna Onyenweanyị doo; Njọ nile m mere Chineke Nna gbaghara.

STATIONS:

Ike agwụgo mo, n’ajọ omume, m were yọba Chineke Nna onyeọma.

1. Ọ bụ onye ga-adịrị mụ ka Kristi Onye nwe m, Kristi moo kuziere m ụzọ nke eluigwe Kristi doo.

2. Ebolụ ngị obe n’ubu, akpọdolụ Ngị n’obe, bụ ife omimi nzọpụta anyị, ndokwa maka anyị nile. Dinwenụ anyị Jesu Kristi…

3. Biko Chukwu, ọbụ n’obi umeanị ka-anyị ji bịa sekpuru n’ihu gị, na-ekwupụta mmehie nile anyị mere na-ayọlụ gị k’imere anyị ebere.

4. Marịa dị asọ yọbalụ anyị ka-anyị wee hụ Jesu na anya, ebe okolụ n’elu obe.

5. Jesu ncheta Ị na-asọka, Ị bụ añụrị ndị nọ n’elu ụwa, ma mgbe Jesu gị kwudebe nya bụ ihe kasị ihe nile. Jesu ncheta Ị na-asọka….

6. Ihe ọbụla I mere otu onye n’ụmụnna m, mụ k’imere ya. Agụ na-agụ m I nye m nri….

7. Kristi biko bịa na mmadụ adịghị ike, Ọ bụ ngịnwa ga-enye mmadụ ike nke obi. Bịa onyenwe ụwa Kristi dị mma…

8. Sọ ndị na-eme uche Chineke g’ahụ Chukwu ha ga-enwe ndụ nke dị ọkpụ n’ala eze ya n’ebe kacha elu. Verse: A ga m eso onye nwe m (2wice)

A ga m ahụ ya ebebe.

9. Bịanụ solụ m bee akwa nwoge, lee Marịa k’ọ na-akpọ anyị, zukọbanụ k’anyị bee akwa, akpọgbulu Jesu nna anyị.

10. Sọ gị k’anyị ga-eso rue ọgwụgwụ na ndụ anyị nile, Gị k’anyị ga-ebeku Nna, íhé gị k’anyị ga-eso rue ọgwụgwụ, ọbụla na ụzọ nk’anyị gbaa ọchịchị.

11. Ndị nke m zakenenụ mụ ajụjụ. Gịnị ka m mere ụnụ ji kpọdo m n’obe?

12. Welite anya lee Jesu ebe o koro n’obe, Ọ gbasara ụnụ aka ka o wee nara ụnụ.

13. Kpochapụ njọ anyị mere k’anyị were obi ọcha nye gị otito na ebube Chukwu ebere n’ịhụnanya. Ngị Jesus bụ ndụ nke anyị…..

14. Ka nnukwu afụfụ Gị bụrụ ike m na m o ezigbo Jesu nụrụ nara ekpele m. Obi Jesu dị asọ…..

15. Ụnụ bụ ndị nọ n’elu ụwa, n’ime afụfụ na mkpa. Mgbe nchekwube ii benata ekpo obi wute ụnụ. Welụ n’anya…

16. Gosị m ebere gị, abụ m onye furu efu, onye njọ ka m bụ biko Chineke Nna, Gosị m ebere gị biko onyenwe ụwa.

RECESSION:

Ka Pilate jụrụ Jesu Ị bụ onye Eze? Jesu zara eh A bụ m onye eze. Dinwenụ anyị Jesus na-achị eze n’eluigwe, Eze nke ọra nile, Eze ndị eze.

OR

Chukwu nwe ụwa onye nwe ụwa nile Chukwu ga-ekpe ụwa nile ikpe.

OR

Mmiri nke ndụ na-ezosi ike…

OR

Cheta mụ onyenwe m achụpụna nwodibo gị cheta m onyenwe m chukwu nna m o.

Chukwu biko ewezi n’iwe Nna gbaghara mo, Chukwu biko achụpụna m o n’alaeze gị chukwu.

Emehiela m megide Chineke onye dị afọ mma..

Chọọ Chineke mgbe ọ ka ga-ekwe nchọta, kpọkue ya oge ọ k’anọ nso, chọọ Chineke ugbu a nwanne m chegharịa, bịakwute Chineke n’ime mmụọ na eziokwu, og’enye gị ndụ……

Hymns for Stations of the Cross

Categorized in:

Catholic Hymns, Igbo Hymns,