Ka anyị tobe Chineke anyị [Complete Hymn with Lyrics]
The hymn entitled ‘Ka anyị tobe Chineke anyị‘ is one of the popular Catholic hymns which is used in Igbo Christian communities during worship. Catholic faithful use this hymn as one of the hymns for Mass and other liturgical celebrations. You will find below the lyrics of this hymn.
Ka anyị tobe Chineke anyị Lyrics
K’anyị tobe Chineke anyị Chineke Nna na Nwa, (Nna na Nwa) Otito dịrị ya, dịkwaara Mmụọ-Nsọ wee rue mgbe ebighịebi’ghebi. Soronụ m tobe Chineke (Chineke) Chineke Nna na Nwa (na Mmụọ-Nsọ) Soronụ m too Ya, soronụ m too Atọ n’ime otu dị Ngọzi (Ngọzi). Agụwo m akwụkwọ nke Chineke (Chineke). Akwụkwọ nk’Oziọma (Ịgụwo ya?) Soronụ m too Ya, Soronụ m too Atọ n’ime Otu dị Ngọzi. (Ngọzi) Ụwa juru n’ọchịchịrị (n’ọchịchịrị). Mmadụ dịk’anụ ọhıa (Anụ-ọhịa). Mmadụ nk’ekeziri, Mmadụ nke nwer’uche, Mmadụ nke mehieworo (obi na njọ). Chineke! Chineke! Chineke nke ụwa! Ụmụ Gị na-akpọ Gị (Na-akpọ, na-akpọ Gị na-akpọ Gị, na-akpo Gị) Na-akpọ, na-akpọ Gị, na-akpọ na-akpọ Gị k’imeere anyị ebere’bere. Ihe nile nke dị n’ụwa, ha dum bụ ọrụaka Gị. Anụmanụ na mmadụ na mmiri, ya na ọkụ na anyanwụ, na ọnwa nke dị n’igwe (dị n’igwe). Ahịhịa dị n’im’ọhịa na osisi, na ikuku na aja ala na ihe dum n’ihe dum (n’ihe dum). Ha dum bụ nke Gị (dum bụ nke Gị) Ezi Chineke (Ekele dịrị Gị).
Bass: Biko bịanụ k’anyị soro tobe Chineke doo ọbụ Nna doo, ọbụ Eze doo otito dịrị Chineke doo, otito dịrị Gị doo.
Sop: Doo, doo, doo, doo, doo, doo, doo, doo, doo, doo, doo, doo, doo. Emehiewo nnukwu n’okwu m, n’omume n’echiche m (n’echiche m). Arịọ m Gị doo Nna gbaghara m ha ncha Emehiewo m n’ezie (n’ezie) O Nna doo me’eree anyị ebere.
Sop: Otito diri Chineke Nna (2)
Ref: O Nna doo meer’anyị ebere
Sop: Dịrị ya rue mgbe nile (2)
O Nna doo meer’anyị ebere
Sop: Ebere, ebere, O Nna doo meer’anyị ebere Ebere, ebere, O Nna doo meer’anyị ebere Ebere, ebere, O Nna doo meer’anyi ebere.
Other Catholic Igbo Hymns
- Chekwube Jesu Ọ ga-adị mma
- Chukwu nke bi n’igwe nụrụ
- Chukwu kere ụwa
- Chukwu Nna nke amamihe
- Chukwu Nna bi n’igwe nụrụ akwa ụmụ gị
- Ekene Ezenwanyị
- Hụnụ ibe ụnụ n’anya
- Ka anyị tobe Chineke anyị
- Ka anyị tobe Dinwenụ
- Kuziere anyị ụzọ Gị
- Mba nile ga-akpọ isi ala
- Ndị mmadụ kelenụ Chineke
- Nna anyị Chineke bi n’igwe
- Nwee ntachi obi