Ka anyị tobe Dinwenụ [Complete Hymn with Lyrics]
The hymn entitled ‘Ka anyị tobe Dinwenụ‘ is one of the popular Catholic hymns which is used in Christian communities during worship. Catholic faithful use this hymn as one of the hymns for Mass and other liturgical celebrations. You will find below the lyrics of this hymn.
Ka anyị tobe Dinwenụ Lyrics
d:r:d/m:-:-/s:-:m/m:-:-/d:m:m/d:r:-/m:d:d/d:-:-//
Chorus: K’anyị tobe Dinwenụ
Tobe Aha ya ebighịebi.
1. M ga-agọzi Chukwu mgbe nile. M ga-akpụ otito ya n’egbugbere ọnụ m mgbe nile. Mkpụrụobi m ji Chukwu etu ọnụ ka ndị ume ala nụrụ ṅụrịa ọṅụ.
2. Sonụ m kwupụta ka Chukwu si dị elu, k’anyị bulie aha ya elu. Achọrọ m Chukwu ọza mụ, were wepụ ihe na-atụ mụ egwu.
3. Íhé legidere ya anya nwukere nke ukwu, ihere adịghị eme ha, ogbenye kpọkuru Chukwu Ọ za ya, were nyere ya aka na nsogbu ya nile.
4. Mmụọozi Chineke na-ebinyere ndị na‐atụ Chukwu egwu. Ọ na-azọpụta ha, lee ka ịhụ na Chineke amaka. Aṅụrị ga-abụ nke onye gbabara na nchedo ya.
5. Ndị nsọ tụọnụ Chukwu egwu n’ihi na onweghị ihe na-akpa ndị na-atụ ya egwu. Odum nọ na mkpa agụụ na-agụ ya ma onweghị ihe na-akọ ndị na-achọ Chineke.
6. Bịanụ ụmụ m genụ m ntị. Aga m ikuzir’ụmụ ịtụ Chukwu egwu. Onye chọrọ ndụ jureju, onye chọrọ ogologo ndụ onye chọrọ inweta ihe ọma.
7. Ire gị ekwukwo na njọ. Ebugbe ọnụ gị gbara asị ọsọ gbaara njọ ọsọ mebe mma chọwa udo chọsie ya ike.
8. Anya Chineke dị n’ebe ndị kwụbara aka ọtọ nọ. Ntị ya dị n’arịrịọ ha, Chineke na-agbarụ ihu n’ebe ndị njọ nọ ka ewepụ ncheta ha n’ụwa.
9. Mgbe ha kpọkuru Chukwu Ọ na-aza ha. Zọpụta ha na nsogbu ha. Dinwenụ nọdebere ndị obi n’ewute. Ọ na-azọpụta mmụọ gbariri agbari.
10. Ahụhụ onye kwụbara aka ọtọ dị ọtụtụ mana Chineke na-azọpụta ya na ha nile, Ọ na-echekwaba ọkpụkpụ ya nile, otu n’ime ha agaghị agbaji.
11. Ajọ ihe ga-egbu ndị ajọ ihe, ndị kpọrọ ndị ọma asị ga-enweta amamikpe Chineke na-azọpụta ndị Odibo ya. Onweghị onye chekwubere na ya ga-enwe amamikpe.
Other Catholic Igbo Hymns
- Chekwube Jesu Ọ ga-adị mma
- Chukwu nke bi n’igwe nụrụ
- Chukwu kere ụwa
- Chukwu Nna nke amamihe
- Chukwu Nna bi n’igwe nụrụ akwa ụmụ gị
- Ekene Ezenwanyị
- Hụnụ ibe ụnụ n’anya
- Ka anyị tobe Chineke anyị
- Ka anyị tobe Dinwenụ
- Kuziere anyị ụzọ Gị
- Mba nile ga-akpọ isi ala
- Ndị mmadụ kelenụ Chineke
- Nna anyị Chineke bi n’igwe
- Nwee ntachi obi