Nwee ntachi obi [Complete Hymn with Lyrics]

The hymn entitled ‘Nwee ntachi obi‘ is one of the popular Catholic hymns which is used in Christian communities during worship. Catholic faithful use this hymn as one of the hymns for Mass and other liturgical celebrations. You will find below the lyrics of this hymn.

Nwee ntachi obi Lyrics

1. Nwee ntachi obi n’ụwa adala mba m’oli

Setịpụ aka gị merie ihe ọnwụnwa.

Cheta na ọdị mgbe ekwensu na-anwa ike ya

Ma n’olu Chineke sị gị nwee ntachi obi.

Chorus: Lee anya lee anya n’ihu Chukwu

Tụkwasị obi gị n’ịhụnanya

Ọdịghị mgbe Chukwu g’ekwe k’ike

Nke ha jur’ụwa merie nke ya

Anyị n’aga n’ime ahụhụ nk’ụwa

Anyị n’eru uju oge nile

Ma olu nke Chukwu na-asị anyị

Alala azụ nwee ntachi obi.

2. Ọtụtụ ndị mmadụ ndị obi ha n’egbu mgbu mana ha chet’ahụhụ nke si na nwata hụ, Ma olee ihe g’enye ha obi añụrị? Ọbụ naanị ntụkwasị obi na ntachi obi.

3. Olee mgbe ahụhụ nke ụwa ga-agabiga n’ụzọ m?

Olee mgbe nsogbu nke ụwa ga-apụ n’ụzọ nke m?

Amakwa m n’ihe ndị a nile ga-agabiga

Maọbụrụ na okwukwe nke m dị na ntachi obi.

Other Catholic Igbo Hymns

Other Categories of Catholic Hymns

Categorized in:

Catholic Hymns, Igbo Hymns,