Onyenwe m Chineke Akpọgo Nwodibo ya [Complete Hymn with Lyrics]
The hymn entitled ‘Onyenwe m Chineke Akpọgo Nwodibo ya‘ is one of the popular Igbo Catholic Ordination hymns which is used in Christian communities during worship. Catholic faithful use this hymn as one of the hymns for Mass and other liturgical celebrations. You will find below the lyrics of this hymn.
Onyenwe m Chineke Akpọgo Nwodibo ya Lyrics
s.s:m:m.d/s,:-:s,/d.d:d:s,.s,/l,:-:-/
Chorus: Onyenwe m Chineke akpọgo Nwodibo ya onye m chiri eze ka m kwụbara n’ugwu dị nsọ n’usoro nke Melchisedech.
1. Ụnụ ahụgo nwa Chineke etere ude n’isi ụnụ ahụgo nwa Chineke etere ude n’isi kelee ezigbo nwa Chineke etere ude n’isi.
2. Chineke na-aza ekpere anyị, onye kere ụwa anụgo arịrịọ anyị. O setịpụgo aka ya wee kpọrọ nwodibo ya ka ọbụrụ onye nke ga-agara ya ozi.
3. Gaa chịba igwe atụrụ nke bụ ọrụ nke o nyere gị adala mba n’ọrụ n’ịgbasa oziọma Chukwu ka aga egbochicha n’igbusị ụmụ atụrụ, atụrụ m ga-añụrụ mmiri n’ụmị nke nzọpụta.
4. Onye ahụ dị nsọ emegoro anyị mma wee nụrụ ekpere anyị wee nụrụ arịrịọ anyị Chukwu anyị ọbụla Chineke ekele dịrị gị Chineke dịrị gị dalụ o.
5. Otito dịrị Chineke bụ Nna anyị, dịrị Chukwu Nwa, dịkwara Mmụọ Nsọ otito dịrị Chineke bụ eze anyị onye kpọlitere gị n’ọchịchị ụkọchukwu.
Other Catholic Igbo Ordination Hymns
- Gaanụ n’ụwa ka ụnụ Kuziwere mba nile
- Onyenwe m Chineke Akpọgo Nwodibo ya
- Onye m Chiri Eze
- Ọ bụrụgo Ụkọchukwu
- Ịbụ Ụkọchukwu Ebebe
- Ñụrịba Ị Bụrụgo Ụkọchukwu
- Echigo gị Ụkọchukwu
- Aja Ịbụ Ụkọchukwu
- Onyenwanyị Ahọrọgo gị dịka Samuel
- Ụkọchukwu Ebighịebi