Angelus Prayer in Igbo Language
Here is Angelus Prayer in Igbo Language which is said by Catholic faithful by 12:00 and 6:00 during all season, except Easter when Regina Caeli is prayed.
Angelus Prayer in Igbo Language
V. Mmụọma nke Osebụrụwa gwapụtara Maria
R. O wee tụrụ ime site na ike nke Mmụọ Nsọ
V. Ekele Maria……..
V. Ledụ odibo nwanyị nke Osebụrụwa
R. Ka orere m ka I si kwu
V. Ekele Maria……..
V. Okwu emere Ahụ
R. O wee binyere anyị
V. Ekele Maria…….
V. Rịọbara anyị arịrịọ O Nne nke Chukwu dị asọ
R. K’anyị wee tosị Ị nata nkwa nke Kristi.
ARỊRỊỌ
O Chukwu anyị na-arịọ Gị ka I hunye grasịa gị n’ime obi anyị k’anyị bụ ndị angel butere ozi wee mara I were ahụ nke Kristi Nwa gị site n’afụfụ ya na obe ya wee bata na otito nke mbilite n’ọnwụ ya. Site na Kristi Dinwenụ anyị, Amen.
V. Otito dịrị Nna na Nwa na Mmụọ Nsọ…(ugboro atọ)
R. Etu ọdị n’izizi na kịta na-ekpo nile n’ụwa ebebe Amen. (ugboro atọ)
V. Ka mkpụrụobi ndị nile kwerenụ gara aga
R. Site n’ebere nke Chukwu wee zuo ike na ndokwa.