Anyị Bịara Abịa n’elu ụwa [Complete Hymn with Lyrics]

Anyị Bịara Abịa n’elu ụwa [Complete Hymn with Lyrics]

The hymn entitled ‘Anyị Bịara Abịa n’elu ụwa‘ is one of the popular Igbo Catholic Lent/Burial hymns which is used in Christian communities during worship. Catholic faithful use this hymn as one of the hymns for Mass and other liturgical celebrations. You will find below the lyrics of this hymn.

Anyị Bịara Abịa n’elu ụwa Lyrics

Chorus: Ee anyị bịara abịa n’elu ụwa ee!

Eluigwe bụ ebe obibi nke mmadụ ee!

Elu ụwa bụ oriri k’anyị pụtara

onye nọjuru o welie isi lewe anya n’igwe.

1. Gị bụ mmadụ i chezọgo na anyị bịar’ịzụ ahịa n’elu ụwa, K’ichezọgo n’ịbụ aja mmadụ bụ aja, chetakwa na anyị zụchaa ahịa n’ụwa anyị ga-ala ebe obibi anyị n’igwe.

2. Gị bụ mmadụ i chezọgo n’ọbụ Chukwu nwe ụwa, K’ichezọgo n ihe nile dị n’ime ya bụkwa nke ya, Chetakwa na ihe nile ị na-ekpokọ n’elu ụwa onweghị nke ị ga-eji laa n’igwe.

3. Gị bụ mmadụ i chezọgo na Chukwu na-ahụ gị mgbe dum, K’ichezọgo na ọ na-ahụ ihe nile i bu n’uche, matakwa na ezigbo ihe na nke ọjọọ i mere gbọtọ n’ihu Chukwu oge nile.

Other Igbo Catholic Lent/Burial Hymns

Other Catholic Hymns

NEW! Catholic Sunday and Daily Mass Readings for 2026

X