Butenụ Onyinye Dị Mma [Complete Hymn with Lyrics]

The hymn entitled ‘Butenụ Onyinye Dị Mma‘ is one of the popular Igbo Hymns which is used in Christian communities during worship. Catholic faithful use this hymn as one of the Offertory Hymns for Mass and other liturgical celebrations. You will find below the lyrics of this hymn.

Butenụ Onyinye Dị Mma Lyrics

Chorus: Butenụ onyinye dị mma ka anyị nye Chineke

Butenụ onyinye dị mma ka anyị nye Chineke

K’anyị nyenụ Chineke, Onyinye

K’anyị nyenụ Chineke onyinye

K’anyị nyenụ Chineke onyinye di mma n’ezie

N’altar nke Chukwu dị nsọ.

1. K’anyị werenụ obi añụrị, obi dị ọcha

nke na-enweghị atụtụ mana enwekwaghị

nkewa ọbụla n’ime mmụọ,

butere Chineke Onyinye ọga anara ya.

2. Wer’ihe dị mma nye Chineke onyinye,

Wer’ihe dị mma nye Chineke ekele,

nye ekele n’obi ọcha,

Wer’ihe dị mma nye Chineke onyinye,

n’ihina Chineke bụ onye onyinye

Ọg’anara gị gọzikwaa gị nye gị mmaji.

3. O Chukwu, O Chukwu nar’onyinye nke anyị n’ebunye gị,

n’obi tiwara etiwa na nke gwepịara egwepịa nke ị naghị eleghara anya,

Biko nara n’ihi ọkpara gị Jesu Kristi,

Onye mere ka mụ na gị dịkwa mma na Kalvarị.

4. N’ime ụlọ Nsọ gị k’anyị na-ebunye gị onyinye,

Ịhụnanya na obi ọcha bụ Jesu Kristi, n’ụdị achịcha na mmanya

Biko nara gọzie ya hichapụ atụtụ njọ mmadụ,

Ka mmadụ wee dịkwa mma ịnata Jesu Kristi

wee nwetakwa ndụ ebighịebi.

Other Igbo Offertory Hymns

Other Catholic Hymns