Litany of the Blessed Virgin Mary in Igbo Language
Here is Litany of the Blessed Virgin Mary in Igbo Language. The Rosary prayer is recommended to be said daily by every Catholic faithful.
LITANY NKE VIRGIN MARỊA DỊ NGỌZI
Osebụrụwa meere anyị ebele — Osebụrụwa meere anyị ebele
Kristi mel’anyị ebele — Kristi meere anyị ebele
Osebuluwa mel’anyi ebele — Osebụrụwa meere anyị ebele
Kristi nụrụ olu anyị — Kristi nụrụ ayịyọ anyị ebele
Chukwu Nna nke eluigwe — Meere anyị ebere
Chukwu Nwa, Onye mgbapụta nke ụwa — Meere anyị ebere
Chukwu Mmụọ Nsọ — Meere anyị ebere
Ịtọ n’ime ofu dị Ngọzi s’ofu Chukwu — Meere anyị ebere
Maria dị asọ — Yọbalụ anyị ayịyọ
Nne nke Chukwu dị asọ — Yọbalụ anyị ayịyọ
Virgin dị asọ n’etiti Virgin nile — Yọbalụ anyị ayịyọ
Nne Kristi — Yọbalụ anyị ayịyọ
Nne nke nzukọ — Yọbalụ anyị ayịyọ
Nne nke onye wetalụ amara — Yọbalụ anyị ayịyọ
Nne dịkalịsịlị obi ọcha — Yọbalụ anyị ayịyọ
Nne na-enweghị atụtụ — Yọbalụ anyị ayịyọ
Nne na-emelụrọ emelụ — Yọbalụ anyị ayịyọ
Nne na-alụr’alụ — Yọbalụ anyị ayịyọ
Nne kwesịl’ịfụnanya — Yọbalụ anyị ayịyọ
Nne kwesịl’ịtụnanya — Yọbalụ anyị ayịyọ
Nne na-adụ ezigbo ọdụ — Yọbalụ anyị ayịyọ
Nne nke Onye okike — Yọbalụ anyị ayịyọ
Nne nke Onye nzọpụta anyị — Yọbalụ anyị ayịyọ
Virgin nwenarịsịlị uche — Yọbalụ anyị ayịyọ
Virgin kwesịrị nsọpụrụ — Yọbalụ anyị ayịyọ
Virgin kwesịl’ iwuewu — Yọbalụ anyị ayịyọ
Virgin nwenarịsịlị ike — Yọbalụ anyị ayịyọ
Virgin nwel’obi ebere — Yọbalụ anyị ayịyọ
Virgin jidel’okwukwe — Yọbalụ anyị ayịyọ
Ugogbe nk’ezi omume — Yọbalụ anyị ayịyọ
Ụgbọ amamife — Yọbalụ anyị ayịyọ
Isi añụrị anyị — Yọbalụ anyị ayịyọ
Ngị, nke jupụtalụ n’amara — Yọbalụ anyị ayịyọ
Ngị nke tosịrị nsọpụrụ karịa — Yọbalụ anyị ayịyọ
Ngị nke jupụtalụ na nsọpụrụ ebe Chukwu nọ — Yọbalụ anyị ayịyọ
Ifulu rose dị omimi — Yọbalụ anyị ayịyọ
Ụlọ-nche David — Yọbalụ anyị ayịyọ
Ụlọ-nche ọdụ — Yọbalụ anyị ayịyọ
Ụlọ ọla-edu — Yọbalụ anyị ayịyọ
Ụgbọ nk’agba — Yọbalụ anyị ayịyọ
Ọnụ ụzọ nk’igwe — Yọbalụ anyị ayịyọ
Kpakpando nk’ụtụtụ — Yọbalụ anyị ayịyọ
Arụike ndị ọya — Yọbalụ anyị ayịyọ
Onye ogbugbo ndị njọ — Yọbalụ anyị ayịyọ
Onye ntasị obi ndị nọ n’afụfụ — Yọbalụ anyị ayịyọ
Inye aka ndị otu Kristi — Yọbalụ anyị ayịyọ
Eze-nwanyị ndị Mmụọ-ọma — Yọbalụ anyị ayịyọ
Eze-nwanyị ndị oziọma — Yọbalụ anyị ayịyọ
Eze-nwanyị ndị amụma — Yọbalụ anyị ayịyọ
Eze-nwanyị ndị nna ukwu — Yọbalụ anyị ayịyọ
Eze-nwanyị ndị egbul’egbu maka Chukwu — Yọbalụ anyị ayịyọ
Eze-nwanyị ndị nkwupụta okwu Chukwu — Yọbalụ anyị ayịyọ
Eze-nwanyị nke Virgin nile — Yọbalụ anyị ayịyọ
Eze-nwanyị ndị nile dị nsọ — Yọbalụ anyị ayịyọ
Eze-nwanyị atụl’ime ya n’eji njọ — Yọbalụ anyị ayịyọ
Eze-nwanyị nke Rosary dịkalịsịlị nsọ — Yọbalụ anyị ayịyọ
Eze-nwanyị ebugolo n’eluigwe — Yọbalụ anyị ayịyọ
Eze-nwanyị nke ndokwa — Yọbalụ anyị ayịyọ
Nwa-atụrụ nke Chukwu, Onye na-ekpochapụ njọ nke ụwa — Wepụ ọpịpịa dịrị anyị, Dinwenụ anyị
Nwa-atụrụ nke Chukwu, Onye na-ekpochapụ njọ nke ụwa — Nụrụ ayịyọ anyị Dinwenụ anyị
Nwa-atụrụ nke Chukwu, Onye na-ekpochapụ njọ nke ụwa — Meere anyị ebere.