Catholic Night Prayer in Igbo [Full Version]
Here is Catholic Night Prayer in Igbo. This prayer is recommended to be said by Catholic faithful in the night before going to bed.
V. N’ogbu mmiri ka m nọ akpọku Gị Dinwenụ,
R. Dinwenụ nụrụ olu m
V. Chee ntị n’obi ebere Gị,
R. Nụrụ ayịyọ m
V. Dinwenụ ọ bụrụ na I depụtawa mmehie anyị,
R. Dinwenụ Onye ga-akwụdo?
V. N’ebe Ị nọ enwere mgbaghara
R. Ka e wee na-atụrụ Gị egwu
V. Atụkwasịrị m Dinwenụ obi
R. Obi m nwere ntụkwasị obi n’okwu Ya
V. Mkpụrụobi m na-eche Dinwenụ
R. Karịa etu Onye nche si atụ anya chi ọbụbọ
V. Karịa etu onye nche si atụ anya chi ọbụbọ
R. Ka Izrel si eche Dinwenụ m
V. N’ihi na ọ bụ na Dinwenụ ka ebere dị
R. N’ebe Ọ nọ ka mgbapụta juru
V. Ọ ga-agbapụta Israel
R. N’ime Mmehie ha niile.
V. Nye ha ezumike ebebe Dinwenụ m
R. Ka íhé nke ndụ ebebe chakwasị ha
V. Ka ha zuru ike na ndokwa.
R. Amen.
AYỊYỌ
O Chukwu, onye O masịrị ka ọ gbaghara ma zọpụtakwa anyị, Anyị na-ayọ enyemaka ebere gị n’isi ụmụnne anyị; ndị agbata obi anyị na ndị nile na-emere anyị ọgọ ndị nke hapụgoro ụwa nke a, Mee ka site n’ayịyọ nke Vejin Marịa n’ayịyọ ndị nsọ nile, ka ha nweta oke nke ndụ ebebe.
O Chukwu onye okike na onye mgbapụta nke ndị nile kwere ekwe gbaghara ụmụ odibo Gị ndị a mmehie nile ha metara ka site n’ayịyọ nụnwa anyị ji ezi obi ayọ Gị, ka ha nweta mgbahapụ nke njọ ha na-achọsi ike Gị onye dị ndụ na-achị ebebe ebebe Amen.