Catholic Igbo Morning Prayer [Full Version]

Here is Catholic Igbo Morning Prayer. This prayer is recommended to be said by Catholic faithful in the morning after rising from the bed.

Ayịyo a na-ayọ Mmụọ Nsọ

1. Bịa, O Mmụọ kachasị nsọ

Si n’eluigwe zidata íhé Gị

Ka ha si n’ukpu eze gị n’eludata ka Mmiri

2. Bịanụ, O Nna ndị Ogbenye

Bịanụ O isi nchekwa akụ anyị

Bịanụ, ka I hujupụta ịhụnanya n’obi anyị

3. O onye ntasị obi kachasị mma

O onye ọbịa dị obi ụtọ

Onye Ogbugbo ume ndị ije.

4. Ezumike ma ike gwụ

Onye kachasị ụtọ

Oyi n’oge ekpomọkụ

Onye ntasị obi, na nsogbu

5. O íhé nke ndị dị ngọzi

Chabata n’ime obi

Ndị niile kwere na Gị.

6. E wepụ onyinye Gị

Gịnị fọrọ na mmadụ

O nweghị ihe ga-adị mma.

7. Osebụrụwa sachapụ atụtụ njọ anyị

Gbaa mmiri n’obi kpọrọ nkụ

Gwọ ọrịa nke na-arịa anyị.

8. Hulata obi isi ike n’ime anyị

Were ịhụnanya Gị kpalite

obi anyị jụrụ oyi

Chizie ụkwụ na-agahie.

9. Nye ndị kwere na Gị,

Ezi Onyenweanyị

Ndị tụkwasịrị nchekwube ha n’okwu Gị

Onyinye asaa nka Gị.

10. Nye anyị amara Gị na ndụ anyị

Mgbe anyị ga-ahapụ ụwa

Dubata anyị n’añụrị dị ebebe.

V. Zipụta Mmụọ nke Gị ka e kezie ha

R. Ị ga-eme ihu ụwa ka ọ dị ọhụrụ

V. Yọbara anyị ayịyọ O obi Marịa kachasị nsọ na ịhụnanya.

R. Ka obi anyị wee jupụta n’ọkụ nke ịhụnanya gị, O Marịa.

AYỊYỌ

Anyị na-arịọ Gị, Osebụrụwa, ka I site n’obi ebere Gị runye Mmụọ Nsọ Gị n’ime obi anyị onye jiri amamihe ya kpọkọba anyị ọnụ ma werekwa mkpachapụ anya na-edu anyị.

Chukwu ji ike niile dị ebebe, onye doziri Mmụọ Nsọ ebe obibi tosịrị etosị n’ime obi Marịa dị ngọzi, were ebere mee ka anyị site na ncheta nke Obi Marịa kasị nsọ wee na-adị ndụ. Site na Kristi Dinwenụ anyị. Amen.

(AFTER MENTAL PRAYERS)

O Jesu bi n’ime Marịa – bịa biri n’ime ụmụ odibo Gị, na Mmụọ nke ịdị nsọ Gị, na njupụta n’Ike Gị, n’izu oke nke ụzọ Gị ga, n’owuwe anya nke ezi omume Gị ga, na njikọ nke ihe omimi Gị ga, were ike ọchịchị Gị megide ike ọjọọ niile, site na mmụọ nke Gị nye ha ebube nke Nna.

V. Obi Jesu kasị nsọ

R. Meere anyị ebere

V. Obi Marịa ya na obi nke Jesu jikọtara

R. Bịa nyere anyị aka

V. Ụnụ ndị isi mmụọ ọma na ndị mmụọ ọma niile.

R. Yọbaranụ anyị ayịyọ

V. Josefụ dị asọ onye nchekwa na onye isi nke ezinụlọ dị asọ

R. Chekwaba anyị

V. Ndị ọchịchị dị ebebe, ndị apọstụlụ Pita na Pọọlụ

R. Yọbaranụ anyị ayịyọ

V. Jọn dị asọ na ụnụ ndị apọstụlụ dị asọ

R. Yọbaranụ anyị ayịyọ

V. Fransis Zevia na Pita Kleva dị asọ

R. Yọbaranụ anyị ayịyọ

V. Teriza nke Obere nwa Jesu dị asọ

R. Yọbara anyị ayịyọ

V. John Paul nke abụọ dị asọ

R. Yọbara anyị ayịyọ

V. Micheal Iwene Tansị dị ngọzi

R. Yọbara anyị arịrịọ.

Other Catholic Prayers

Categorized in:

Catholic Prayers,