Ka Anyị Ñurịa Okwukwe Anyị Enwego isi [Complete Hymn with Lyrics]
The hymn entitled ‘Ka Anyị Ñurịa Okwukwe Anyị Enwego isi‘ is one of the popular Igbo Catholic Easter hymns which is used in Christian communities during worship. Catholic faithful use this hymn as one of the hymns for Mass and other liturgical celebrations. You will find below the lyrics of this hymn.
Ka Anyị Ñurịa Okwukwe Anyị Enwego isi Lyrics
Chorus: Bịanu k’anyị ñụrịa k’anyị ñụrịa, k’anyị ñụrịa, k’anyị nweb’añụrị, k’anyị nweb’añụrị, k’anyị nweb’añụrị na Dinwenụ, nweb’añụrị, Dinwenụ anyị ebilitego n’ọnwụ k’osiri kwuo, alleluia alleluia alleluia, K’anyị ñụrịbanụ, k’anyị goribenụ nweb’añụrị makana okwukwe anyị abụgo ihe nwer’isi.
1. Dinwenụ gwara Dinwenụ, nọdụ, ala n’aka nri m akwatuchaa nd’iro gị, kwatuchaa ha mere gị ha ebe mgbakwasị ụkwụ Gị.
2. Ọbụrụ na Dinwenụ anyị ebilighị n’ọnwụ lokene gịnị k’anyị ga-eme, kedụ ihe anyị ga-eme, okwukwe anyị na ahụhụ na ọrụ ọma anyị nile abụrụ ihe nkịtị. Ma ekele dịrị Chineke Nna onye mere k’obilie, k’obilie k’obilie. Otito dịrị ya ebighịebi n’ụwa n’igwe.
3. Mbilite n’ọnwụ ya emego ka okwukwe anyị sie ike, gbanye mgbọrọgwụ, na chekwube n’ịhụnanya, k’anyị gosịnụ Chineke n’ihe omere anyị atọk’anyị. Sitena inye ya ekele, nye y’otito sọpụkwaara ya, sekpukwaara ya n’ime mmụọ na eziokwu.
4. Site na mbilite n’ọnwụ ya, mmadụ enwegokwa olil’anya. Esemokwu dịbu n’etiti mmadụ na Chukwu edoola, odoola, odoola, mmadụ enwegokwa ọnọdụ n’ihu Chukwu. Site n’aja ojiri onwe ya chụ site na mbilite n’ọnwụ ya mmadụ enwegokw’olilanya, Esemokwu dịbu n’etiti mmadụ na Chukw edoola, ọgwụla, odoola, ọgwụla odoola ọnụma ajụrụla, Anyị enwegokwa ọnọdụ n’ihu Chukwu site n’aja ojiri onwe ya chụ. Aja dị ok’ọnụ, Aja n’enweghị atụtụ zuo oke. Aja n’enweghị mtụ m ọrụ. Aja bupụrụ mmehie sachakwa anyị na njọ, anyị abụr’ụmụ Chukwu ụmụ Chukwu ụmụ mmadụ bilienư kelee.
5. Otito dịrịzianụ Chukwu Nna Onye okike na Chukwu Nwa Onye nzọpụta dịrị Chukwu Mmụọ Nsọ, Onye na-edo anyị nsọ. Otito dịrị atọ n’otu dị ngọzi ebighịebi Amen, Ebighịebi Amen. Ebighịebi Amen. Ebighịebi Amen.
Other Igbo Easter Hymns
- Kristi Ebilitewo
- Ụnụ Ncha bụ ndị Kwerenụ
- Bịa Mmụọ Nsọ bịa bịa biri n’obi m
- Bịa Mmụọ Nsọ Kpalite obi ụmụ Gị
- Jesu Kristi Bilitenụ
- Ka Anyị Ñụrịbanụ ka Anyị Goribenụ
- Ka Anyị Ñurịa Okwukwe Anyị Enwego isi
- Onye bi n’igwe Mee Ebere
- Kristi Kulitere n’ọnwụ
- Bịa O Mmụọ Kachasị Nsọ
- Chukwu Mmụọ Nsọ Onye Okike
- Chukwu Mmụọ Nsọ onye kere ndụ nile
- Chukwu Mmụọ Nsọ bịa leta Anyị
- Ụwa nile Goribe
- Ụwa nile Ñụrịa
- Ñụrịbanụ ọñụ Kristi Ebilitewo
- Ñụrịanụ Kristi Ebilitego