Igbo Mass Readings for October 25 2027, Mọnde Izuụka nke Iri Atọ N’Oge Nkịtị

Igbo Mass Readings for October 25 2027, Mọnde Izuụka nke Iri Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 25 2027, Mọnde Izuụka nke Iri Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 8:12-17

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Rom

Ụmụnna m, anyị ji ụgwọ. Ma ọ bụghị anụahụ ka anyị ji ụgwọ ịdị ndụ dịka ọchịchọ ya si dị. Ọ bụrụ na ụnụ na-ebi ndụ dịka anụahụ si chọọ, ụnụ ga-anwụ.

Ma ọ bụrụ na ụnụ ga-eji ike nke Mmụọ Nsọ mee ka omume niile nke anụahụ nwụọ, ụnụ ga-adị ndụ. N’ihina ndị niile Mmụọ nke Chineke na-edu bụ ụmụ Chineke.

Mmụọ nke ụnụ natara abụghị mmụọ nke ịbụ ohu, nke ga-eme ka ụnụ laghachi n’ịtụ egwu. Mmụọ nke ụnụ natara bụ mmụọ nke ụmụ Chineke, nke na-eme ka ụnụ tikuo Chineke sị, ‘Abba! Ezi nna.’

Mmụọ Nsọ ahụ n’onwe ya sokwa mmụọ anyị na-agba ama na anyị bụ ụmụ Chineke. Ọ bụrụ na anyị bụ ụmụ Chineke, anyị sokwa na ndị ha na Kristi ga-eketa alaeze ya. Ọ bụrụ na anyị soro Kristi taa ahụhụ, anyị ga-esokwa ya keta oke otito ya.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 68: 2, 4, 6-7, 20-21

Azịza: Chineke anyị bụ Chineke nke nzọpụta.

1. Ka Chineke bilie, ka ndịiro ya gbasasịa,

Ka ndị niile kpọrọ ya asị gbapụ n’ihu ya

ndị eziomume na-añụrị ọñụ,

ha na-añụrị oke ọñụ na-ekwekwa ukwe añụrị.

Azịza: Chineke anyị bụ Chineke nke nzọpụta.

2. Nna ndị na-enweghị nne na nna,

Onye ogbugbo ndị ajadu

Otu ahụ ka Chineke sị dị n’ebe obibi ya dị nsọ;

Onye na-enye ndị nọ na mkpọrọ añụrị

Site n’ime ka ha nwere onwe ha.

Azịza: Chineke anyị bụ Chineke nke nzọpụta.

3. Ngọzi dịrị Onyenweanyị ụbọchị niile,

Chineke na-azọpụta anyị, na-ebukwa ibu anyị

Chineke anyị a bụ Chineke na-azọpụta

ọ bụ Onyenweanyị Chineke nweụzọ e si agbanarị ọnwụ.

Azịza: Chineke anyị bụ Chineke nke nzọpụta.

MBEKU – Ps. 119:27

Alleluịa, Alleluịa:

Mee ka m ghọta ihe iso ụzọ gị pụtara, ka m wee nwee ike ịchịgharị ọrụ ịtụnaanya gị n’obi m.

Alleluịa.

OZIỌMA – 13:10-17.

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

N’otu ụbọchị izu ike, Jesu nọ n’otu ụlọnzukọ ndị Juu na-akuzi ihe. N’ebe ahụ, e nwere nwaanyị nke mmụọ nrịanrịa ji ihe dịka afọ iri na asatọ.

Ọ rọọla nwanyị ahụ o nweghịkwa ike iguzozi eguzo.  Mgbe Jesu hụrụ ya, Ọ kpọrọ ya sị ya, “Nwaanyị, e meela ka ị pụọ na nrịanrịa gị.” Jesu bikwasara ya aka ya abụọ, ozigbo nwaanyị guzozie, wee too Chineke.

Iwe were onyeisi ụlọnzukọ ahụ, n’ihina Jesu gwọrọ ọrịa n’ụbọchị Sabat; maka nke a ọ gwara ndị mmadụ sị, “Ọ dị ụbọchị isii iwu nyere mmadụ ike ịrụ ọrụ, bịanụ n’ụbọchị ndị ahụ ka a gwọọ ụnụ, ọ bụghị n’ụbọchị sabat.”

Onyenwenayị zara ya sị, “Ụnụ ndị ihu abụọ! O nwere onye n’ime ụnụ na-anaghị atọpụ ehi ya mọbụ ịnyịnyaibu ya n’ụlọ anụ, duga ya ka ọ ñụọ mmiri n’ụbọchi izuike?

Ọ bụ na nwaanyị a bụ ada nke si n’agbụrụ Abraham, onye Ekwensu kere agbụ, kamgbe afọ iri na asatọ ekwesịghị ka a tọpụ ya agbụ n’ụbọchị izuike?”

Ka ọ na-ekwu nke a, ihere mere ndịiro ya niile, ma ndị mmadụ niile nwere añụrị maka ihi ọrụ ebube nke ọ rụrụ.

Igbo Mass Readings for October 26 2027, Tuezde Izuụka nke Iri Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for October 25 2027, Mọnde Izuụka nke Iri Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

NEW! Catholic Sunday and Daily Mass Readings for 2026

X