Igbo Mass Readings for August 22 2024, Ncheta Ịbụ Ezenwaanyị nke Marịa

Igbo Mass Readings for August 22 2024, Ncheta Ịbụ Ezenwaanyị nke Marịa.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 22 2024, Ncheta Ịbụ Ezenwaanyị nke Marịa.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 9:1-6

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya

Na mgbe gara-aga, o mere ka e lelia ala Zebulum na ala Naftali, mana n’oge na-abịanụ ọ ga-akwanyere ndị niile bi n’ụzọ nke oke osimiri ugwu; ala nke dị n’ofe Jọdan, Galili nke mba ụwa niile.

Ndị na-aga ije n’ọchịchịrị ahụla nnukwu ihe; Ndị bi na ndo nke ọnwụ, ihe achakwasala ha. I meela ka ndị bi n’obodo ahụ bawanye n’ọnụọgụgụ; i mekwaala ka añụrị ha dị ukwuu;

Ha ga-enwe añụrị n’ihu gị dịka ha si enwe ọñụ n’oge owuwe ihe ubi, ya na otu ndị mmadụ si enwe ọñụ mgbe ha na-eke ihe ha lụtara n’agha. Ị kụjiela ịnyagba na-anyịgbu ya, na mkpara nke a na-akụ ya n’ubu, na mkpara igwe nke ndị na-emesi ya ike, dịka ọ dị n’ụbọchị nke ndị Midian.

Akpụkpọ ụkwụ ọbụla ndị agha ji zọpịasịa ihe n’ọgbọ agha ma uwe a tụrụrụ na ọbara, ha niile ga-abụ ihe agbara ọkụ. N’ihina amụpụtaara anyị otu nwa, e nyekwara anyị otu nwa nwoke; ọchịchị ga-abụkwa nke ya, aha a ga-akpọkwa ya bụ “Onye ndụmọdụ dị ebube, Chineke nke bụ dike, Nna dị Ebeebe, Eze nke udo.”

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 112: 1-2, 3-4, 5-6, 7-8.

Azịza: Añụrị na-adịrị onye na-atụrụ Onyenweanyị egwu, onye ji ọñụ na-edebe iwu ya.

1. Alleluia! Añụrị na-adịrị onye na-atụrụ Onyenweanyị egwu,

onye ji ọñụ na-edebe iwu ya!

Ụmụ onye dị otu a ga-abụ ndị nwere ike n’ụwa,

agbụrụ onye ezigbo omume ga-enweta ngọzi. Azịza

2. Ezinụụlọ ya ga-enweta akụnụụba,

eziomume ya agaghị enwe mgbanwe

N’ihina onye ezigbo omume ga-achawapụta

dịka ihe n’etiti ọchịchịrị

ọ dị ebere, ịhụnaanya na-akwụba aka ọtọ. Azịza

3. Ya bụ ezigbo mmadụ anaghị ana ọmụrụnwa ma o binye ego,

ọ bụ onye eziokwu n’ihe niile ọ na-eme.

Ebe eziomume chedoro ya, ọ na-enwe ịkwụdosiike,

ọ na-ahapụ ncheta ga-adị ebeebe n’azụ ya. Azịza

4. Ebe obi ya na nchekwube ya dị n’Onyenweanyị

ọ gaghị atụ egwu ịnata ozi ọjọọ.

O ji ntachi obi emeri egwu ya,

n’ikpeazụ ọ na-emeri ndịiro ya. Azịza

MBEKU

ALLELUIA, ALLELUIA:

Mmụọọma ahụ bịakwutere Marịa sị ya, “Ekele, i jupụtara na grasịa, Osebụrụwa nọnyere gi”.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 1: 26-38.

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

N’ọnwa nke isii, Chineke zigra Mmụọọma Gebrel ka ọ gaa n’obodo Galili a na-akpọ Nazaret; ka ọ gakwuru otu nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, onye ikwunibe ya kwekọrịtara na otu nwoke aha ya bụ Josef, nke si n’agbụrụ Devid, ga-alụ.

Aha nwaagbọghọ ahụ bụ Marịa. Mmụọọma ahụ bịakwute Marịa sị ya, “Ekele, i jupụtara na grasịa, Osebụrụwa nọnyere gị!” Obi lọrọ ya mmiri nke ukwuu n’ụdị ekele a, nke mere na ọ malitere ịtụle n’uche ya ihe ụdị ekele a pụtara. Mmụọọma ahụ sịrị ya, “Atụla egwu, Marịa, n’ihina ị natala ngọzi n’aka Chineke.

Lee, ị ga-adị ime, mụta nwa nwoke; aha ị ga-akpọ ya bụ Jesu. Ọ ga-adị ukwuu, a ga-akpọkwa ya nwa onye kacha elu. Dinwenụ Chineke ga-enye ya ocheeze nna ya Devid.

Ọ ga-achị ezinụụlọ Jekọb ebeebe, ala eze ya agaghị enwe ọgwụgwụ.” Marịa jụrụ Mmụọọma ahụ sị, “O lee otu nke a ga-esi mee ebe ọ bụ na-amaghị m nwoke.

Ma Mmụọọma ahụ zara ya sị, “Mmụọ Nsọ ga-abịakwasa gị; ike nke onye kacha elu ga-ekpuchi gị. N’ihi nke a, a ga-akpọ nwa ahụ Ị ga-amụ; Onye nsọ, nwa Chineke.

Lee Elizabet onye ikwu gị, onye ndị mmadụ na-akpọ nwaanyị aga, atụrụla ime n’agadi ya; ugbu a ọ dị ime ọnwa isii. N’ihina ebe Chineke nọ, ọ nweghị ihe nyịrị omume.”

Marịa kwuru sị, “Lee, abụ m odibo nwaanyị nke Osebụrụwa, ka o reere m ka i siri kwu.” Mmụọọma ahụ wee si n’ebe ọ nọ pụọ.

Igbo Mass readings for August 23 2024, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume

Igbo Mass Readings for August 22 2024, Ncheta Ịbụ Ezenwaanyị nke Marịa.

NEW! Catholic Sunday and Daily Mass Readings for 2026

X