Igbo Mass Readings for November 13 2027, Satọde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Nkịtị

Igbo Mass Readings for November 13 2027, Satọde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 13 2027, Satọde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 18:14-16; 19:6-9

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Amamihe

Mgbe ihe niile dajụrụ n’etiti abalị, okwu gị jupụtara n’ike si n’ocheeze gị dị n’eluigwe gbadata n’ala ahụ a bụrụ ọnụ. Ọ bịara ka onye agha dị njikere ịmalite ọgụ.

Onye ji iwu gị kwụ ọtọ ka mma gha dị nkọ. O jiri ụkwụ abụọ kwụrụ n’ala, isi ya na-emetụ urukpu, o mere ka ozu mmadụ jupụta ụwa. Iji chekwaba ndị nke gị n’ebe ihe nsogbu niile dị, ihe niile i kere gbanworo site n’iwu i nyere.

Urukpu kpuchigidere ogige ebe ha bi, ala akọrọ pụtara n’ebe mmiri juburu; osimiri uhie e wee nwee okporo ụzọ n’etiti ya. Osimiri ahụ na-ejupụta n’oke ebili mmiri a bụrụzie ala puru ahịhịa.

Site na nchedo nke aka gị, ha gafere dịka otu obodo, oge ha hụchara ọrụ ebube ahụ. Ha na-enwerị añụrị ka ịnyịnya ndị na-akpa nri, na-awụli elu ka ụmụ atụrụ, ha na-eto gị O Yahweh, Onye zọpụtara ha.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 105: 2-3, 36-37, 42-43

Azịza: Chetanụ ọrụ ebube niile Chineke rụrụ.

1. Kweerenụ ya ukwe, kụọrọnụ ya egwu,

Kwupụtanụ ọrụ ịtụnaanya ya niile,

Nwebenụ añụrị n’aha nsọ ya

ka obi niile na-achọ Chineke ñụrịa.

Azịza: Chetanụ ọrụ ebube niile Chineke rụrụ.

2. O gburu dịọkpara niile nọ n’ala ha

Mkpụrụ mbụ niile ike ha wetara

Mgbe ahụ o jiri ọlaọcha na ọlaedo wee dupu Izrel,

O nweghịdị otu onye nke ọ hapụrụ n’azụ.

Azịza: Chetanụ ọrụ ebube niile Chineke rụrụ.

3. N’ihina o chetara nkwa ya dị nsọ,

nke o nyere nwodibo ya bụ Abraham,

O ji ọñụ duru ndị nke ya aga,

O ji ukwe edu ndị ọhọọrọ.

Azịza: Chetanụ ọrụ ebube niile Chineke rụrụ.

MBEKU – Ps. 25: 4, 5.

Alleluịa, Alleluịa:

Kụziere m ụzọ gị, Onyenweanyị, dube m n’ụzọ eziokwu gị.

Alleluịa.

OZIỌMA – 18:1-8

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Jesu gwara ha ụkabụilu iji kuziere ha na ọ dị mkpa ka ha nọgide n’ekpere mgbe niile, ghara ịda mba.

Ọ gwara ha sị: “N’otu obodo, e nwere otu onye ọkaikpe nke na-anaghị atụrụ Chineke egwu, nke ọ na-asọpụrụ mmadụ ibe ya.  

E nwekwara otu nwaanyị isimkpe bikwa n’obodo ahụ, onye na-abịakwute ọkaikpe a kwa mgbe kwa mgbe, na-arịọ ya sị, ‘kpepụta m n’aka onye iro m.’

Na mbụ onye ọkaikpe a achọghị ịnụ arịrịọ nwaanyị a. Ma o mesịrị tụgharịa obi sị, ‘Ọ bụ eziokwu na adịghị m atụ egwu Chineke, adịghị m asọpụrụ mmadụ, ma n’ihi nsogbu nwaanyị isimkpe a na-enye m, aga m ekpepụta ya.

Ọ bụrụ na m emeghị otu a, ọ ga-abịagide na-esogbu m, agaghị m ezuru ya ike.’” Onyenweanyị kwukwara sị, “Nụrụnụ ihe onye ọkaikpe a, nke na-adịghị ekpe ikpe ziri ezi kwuru.

Ọ bụ na Chineke agaghị ekpepụta onye nke ya, onye na-akpọku ya ehihie na abalị? Ọ ga-egbu oge tupu ọ zọpụta ha?

Agwa m ụnụ, Ọ ga-ekpepụta ha ọsọọsọ. Ka o sila dị, mgbe nwa nke mmadụ ga-abịa Ọ ga-enwetekwa ndị nwere okwukwe n’elu ụwa?”

Igbo Mass Readings for November 14 2027, Ụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume – Afọ nke Abụọ

Igbo Mass Readings for November 13 2027, Satọde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

NEW! Catholic Sunday and Daily Mass Readings for 2026

X