Igbo Mass Readings for November 11 2025, Tuezde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 11 2025, Tuezde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:23-3:9

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Amamihe

Mana Chineke ekeela mmadụ ka ọ dị anwụ anwụ, o kere ya n’oyiyi nke ya. Ọ bụ anya ụfụ nke ekwensu wetara ọnwụ n’elu ụwa, ndị otu ya bụkwa ndị ga-ahụ ya.

Ma mkpụrụobi ndị eziomume dị n’aka Chineke, o nweghị ahụhụ ọbụla ga-emetụ ha. N’anya ndị nzuzu, ha dịka ndị nwụrụ anwụ, ngafe nke ha dịka ahụhụ n’onwe ya.

Nhapụ ha hapụrụ anyị dịka ịla n’iyi, mana ha nọ n’udo. N’ezie, a bịa n’anya mmadụ, ha tara ahụhụ, ma olileanya ha jupụtara n’uju nke anwụ anwụ. A tara ha obere ahụhụ ma ha ga-anata nnukwu ụgwọ.

Chineke n’onwe ya anwaleela ha, were chọpụta na ha tosịrị ibinyere ya. Ọ ñụchaala ha dịka e si añụcha ọlaedo n’ọkụ, bịa nara ha dịka aja nsureọkụ. Mgbe oge nleta ha bịara, ha ga-achawapụta ka ihe, dịka ikerike ọkụ si adapụta n’ukwu ọkụ.

Ha ga-achị mba niile na mmadụ niile, Yahweh ga-abụ eze ha ebighịebi. Ndị ahụ chekwubere na ya, ga-aghọta eziokwu, ndị kwụdosiri ike ga-ebinyere ya n’ịhụnaanya, n’ihina amara na ebere na-eche ndị ahụ ọ họọrọ, ọ na-echekwa ndị nke ya niile.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 34: 2-3, 16-17, 18-19

Azịza: Aga m eto Onyenweanyị oge niile.

1. Aga m eto Onyenweanyị oge niile

Otito ya ga-adị n’egbugbere ọnụ m mgbe ọbụla

Mkpụrụobi m na-egori n’Onyenweanyị

ka ndị umeala nụrụ ma ñụrịa.

Azịza: Aga m eto Onyenweanyị oge niile.

2. Onyenweanyị na-elekọta ndị eziomume anya

Ọ na-egekwa mkpu akwa ha ntị

Mana Onyenweanyị na-agbarụ ihu n’ebe ndị ajọomume nọ

Ọ na-eme ka aghara ichetakwa ha n’ụwa.

Azịza: Aga m eto Onyenweanyị oge niile.

3. Ndị eziomume kpọkuru Onyenweanyị,

Ọ za ha, wee zọpụta ha na nsogbu ha niile

Onyenweanyị na-anọ ndị obi loghara elogha nso,

Na-enyere ndị dara mba na mmụọ aka.

Azịza: Aga m eto Onyenweanyị oge niile.

MBEKU – Jọn 17:17

Alleluịa, Alleluịa:

Were eziokwu gị doo anyị nsọ n’ihina okwu gị bụ eziokwu.

Alleluịa.

OZIỌMA – 17:7-10

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “O nwere onye n’ime ụnụ nke nwere nwodibo na-arụrụ ya ọrụ n’ubi, mọbụ na-azụrụ ya atụrụ, ga-agwa nwodibo ya mgbe o siri n’ugbo bata sị, ‘Bịa rie nri ozigbo?’

Ọ bụ na ọ gaghị agwa ya sị, ‘Kwadoro m nri anyasị, jikekwara onwe gị nke ọma ịgbara m odibo ruo mgbe m ga-ericha, ñụchaa.

E mechaa, ị ga-eri ma ñụkwaa nke gị.’ Ọ ga-ekele nwodibo ahụ n’ihina o mere ihe a gwara ya? Otu a ka ọ dị ebe ụnụ nọ.

Mgbe ọbụla ụnụ mechara ihe a gwara ụnụ, ụnụ ga-ekwu sị, ‘Anyị bụ ụmụodibo etosịghị etosị, ọ bụ ọrụ dịịrị anyị ka anyị rụrụ.”

Igbo Mass Readings for November 12 2025, Wednezde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for November 11 2025, Tuezde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.