Ụwa nile Ñụrịa [Complete Hymn with Lyrics]
The hymn entitled ‘Ụwa nile Ñụrịa‘ is one of the popular Igbo Catholic Easter hymns which is used in Christian communities during worship. Catholic faithful use this hymn as one of the hymns for Mass and other liturgical celebrations. You will find below the lyrics of this hymn.
Ụwa nile Ñụrịa Lyrics
Introduction – treble (solo)
Ụwa nile ñụrịa, ụwa nile ñụrịa,
Ụwa nile ñụrịa ọñụ n’ime Onyenweanyị.
Kwebenụ ukwu ọñụ, tibenụ egwu ọñụ,
ọzọ, ana m asị ụnụ, ñụrịba…
Chorus A: Ñụrịbanụ ñụrịba, ụwa nile
Ụwa nile ñụrịa, ụnụ nile ñụrịa n’ime, Onyenweanyị.
Kwebenụ ukwe ọñụ, tibenụ egwu ọñụ,
ọzọ, ana m asị ụnụ, ñụrịba…
Chorus B: Kwebenụ alleluia,
Kwebenụ alleluia
kwebenụ alleluia n’ebe kachasị elu,
kwebenụ alle-lu-ia, kwebenụ alle-lu-ia,
kwebenụ alle-lu-ia werenụ egwu otito
na ite egwu tobenụ Dinwenụ.
1. Werenụ egwu egwu otito egwu, werenụ ụbọ ụbọ ee ụbọ, werenụ une une, une une, Werenụ opi, opi lololo op’ike opi werenụ ọja ọja nke k’acha mma ọja; ọja dị ụtọ werenụ ọja nke na-adasi ụda ike, tobe Chukwu, tobenụ ya, tobe Chukwu, werenụ ọja na-adasi ụda ike tobenụ ya too Chukwu, too ya, tobenụ Chukwu, ‘ọdị ukwu too Chukwu too Chukwu. (Ch: B)
2. Alleluia toonụ Chukwu alleluia toonụ Chukwu alleluia, alleluia, toonụ ya too ya.
Sop: Alleluia, alleluia, alleluia, alleluia, alleluia.. Toonụ ya, toonụ Chukwu, toonụ Chukwu toonụ Chukwu, toonụ Chineke, ụwa nile, Sekpuere ya toonụ ya too toonụ ya too, toonụ Chineke Nna ụmụ nne m toonụ Chukwu Alleluia (2ice) (Ch: B).
3. Tenor: Bịanụ k’anyị chee echiche nwantịntị tụgharịkwanụ echiche maka Chukwu, ee tụgharịkwanụ obi nwantịntị maka, Chineke maka Chineke hụra’nyị n’anya, hụr’anyị n’anya, Chineke gbapụtara gị o, Chineke gbapụtara mo, Chineke zitere Ọkpara nwa ya k’ọnwụọrọ m ọnwụ maka mmehie m ọ ka ọ nwụọrọ m ọnwụ, ọnwụ n’elu obe maka mo n’ugwu Calvari, ebe ọ nọrọ kpọọ Dinwenụ ntu man’aka ya ma n’ụkwụ.
Treble: Bịanụ k’anyị cheenụ echiche nwantịntị (4 times) Cheta na Jesu nwụrụ n’elu obe maka njọ mo njọ dị ukwu maka njọ mo. Bịanụ k’anyị werenụ ukwe ọñụ toonụ Chukwu tobenụ ya maka n’odi mma.
4. Otito dịrị Nna na Nwa na Mmụọ Nsọ (2ice) ebebe otito otito otito dịrị Nna na Nwa na Mmụọ Nsọ. Otito dịrị Nna na Nwa na Mmụọ Nsọ Otito dịrị Chukwu Nna ebebe, Otito dịrị Chukwu Nwa, otito dịrị Chukwu Mmụọ Nsọ. Ñụrịbanụ, n’ime Onyenweanyị. Kwebenụ ukwe ọñụ, tibenụ egwu ọñụ, ọzọ ana m asị ụnụ ñụrịba, ñụrịbanụ ụwa, Ka ụwa nile ñụrịa, ụwa nile ñụrịba.
Other Igbo Easter Hymns
- Kristi Ebilitewo
- Ụnụ Ncha bụ ndị Kwerenụ
- Bịa Mmụọ Nsọ bịa bịa biri n’obi m
- Bịa Mmụọ Nsọ Kpalite obi ụmụ Gị
- Jesu Kristi Bilitenụ
- Ka Anyị Ñụrịbanụ ka Anyị Goribenụ
- Ka Anyị Ñurịa Okwukwe Anyị Enwego isi
- Onye bi n’igwe Mee Ebere
- Kristi Kulitere n’ọnwụ
- Bịa O Mmụọ Kachasị Nsọ
- Chukwu Mmụọ Nsọ Onye Okike
- Chukwu Mmụọ Nsọ onye kere ndụ nile
- Chukwu Mmụọ Nsọ bịa leta Anyị
- Ụwa nile Goribe
- Ụwa nile Ñụrịa
- Ñụrịbanụ ọñụ Kristi Ebilitewo
- Ñụrịanụ Kristi Ebilitego