Igbo Mass Readings for November 8 2027, Mọnde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Nkịtị

Igbo Mass Readings for November 8 2027, Mọnde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 8 2027, Mọnde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:1-7

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Amamihe

Hụnụ eziomume n’anya, ụnụ bụ ndị na-achịachị n’elu ụwa, jirinụ ịkwụba aka ọtọ na-eche maka Yahweh. Werenụ obi dị ọcha chọba ya. N’ihina ndị na-adịghị anwale ya, na-achọta ya, ọ na-egosi ndị niile na-enweghị obi abụọ n’ebe ọ nọ onwe ya.

N’ihina echiche na-ezighị ezi na-ekewapụ mmadụ n’ebe Chineke nọ, ịnwale onye pụrụ ime ihe niile na-egosi na nzuzu nke mmadụ buru ibu nke ukwuu.

Mba, amamihe agaghị abata n’obi onye ọjọọ, mọbụ onye ahụ jupụtara na njọ. Mmụọ nke amamihe na-asọ aghụghọ, ọ na-agbara atụmaatụ ezighị ezi ọsọ, ọ na-achara ihe ọjọọ mgbe niile.

Amamihe bụ ezi mmụọ, ọ gaghị agbaghara ihe ọjọọ nke onye na-ekwutọ Chineke, ebe ọ bụ na Chineke n’onwe ya na-ahụ ime obi onye ahụ, na-ahụkwa ime mmụọ ya nke ọma, na-anụkwa okwu niile sikwa n’ọnụ ya.

N’ihina mmụọ nke Yahweh ejupụtala ụwa niile, onye jikọtara ihe niile ọnụ maara okwu ọbụla onye kwuru.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 139: 1-3, 4-6, 7-8, 9-10

Azịza: Dinwenụ, Dube m n’ụzọ nke ndụ ebeebe

1. Onyenweanyị, I nyochala m, marakwa m

Ị ma mgbe m nọdụrụ ala ma mgbe m kwụ ọtọ

Ị na-anọ ebe dị anya mara ihe m bu n’uche

Ị mazuru omume m niile

mgbe m na-arụ ọrụ mọbụ mgbe m na-ezu ike.

Azịza: Dinwenụ, Dube m n’ụzọ nke ndụ ebeebe

2. Tupu emeghee m ọnụ m,

Ị maralaarịị ihe m chọrọ ikwu

Ị nọ n’ihu, nọrọkwa m n’azụ;

I ji aka gị na-echekwaba m.

Ụdị amamihe a kariri m nghọta,

Ọ dị oke elu karịa akọnuuche m.

Azịza: Dinwenụ, Dube m n’ụzọ nke ndụ ebeebe

3. Olee ebe m nwere ike ịga iji gbalahụ gị

Ebee ka m ga-agbaga wee pụọ n’ihu gị?

Ọ bụrụ na m agbagoo n’eluigwe, ị nọ ebe ahụ!

Ọ bụrụ na m agaa n’ala mmụọ, ị nọkwa ebe ahụ.

Azịza: Dinwenụ, Dube m n’ụzọ nke ndụ ebeebe

4. Ọ bụrụ na m efegaa n’ọwụwa anyanwụ;

Mọbụ biri n’ọdịda ya na ngafe osimiri,

Aka gị nọkwa ebe ahụ na-edu m;

Aka nri gị na-ejidesi m ike.

Azịza: Dinwenụ, Dube m n’ụzọ nke ndụ ebeebe

MBEKU – 1 Thes 2:13

Alleluia, Alleluia:

Naranụ ozi nke anyị wetaara ụnụ, ọ bụghị dịka okwu mmadụ kama dịka ihe ọ bụ n’onwe ya, okwu nke Chineke.

Alleluia

OZIỌMA – 17:1-6

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ọnwụnwa dị icheiche nke ga-eduba mmadụ na njọ ga-abịarịrị, ma ahụhụ ga-adịrị onye ahụ nke ha ga-esi n’aka ya bịa.

Ọ ga-akara ya mma ma a sị na a nyanyere ya nkume e ji akwọ ihe nri n’olu, tụba ya n’ime oke osimiri, karịa na ọ ga-eduba otu n’ime ụmụaka ndị a na njọ. Kpacharanụ anya ụnụ.

Ọ bụrụ na nwanne gị mee ihe ọjọọ, dụọ ya ọdụ. Ọ bụrụ na o chegharịa, gbaghara ya. Ọ bụrụ na o mehie gị ugboro asaa sị, ‘Echegharịala m,’ ị ga-agbaghara ya.”

Ndị ụmụazụ Jesu gwara ya sị, “Mee ka okwukwe anyị bawanye.” Onyenweanyị azaa ha, “Ọ bụrụ na ụnụ nwere okwukwe buru ibu ka mkpụrụ osisi dịkarịchara nta a na-akpọ mọstad, ụnụ nwere ike inye osisi ọjị iwu sị, ‘ka e fopụ gị, kụkwaa gị n’ime osimiri!’ Ọ ga-erubekwara ụnụ isi.”

Igbo Mass Readings for November 9 2027, Tuezde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for November 8 2027, Mọnde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

NEW! Catholic Sunday and Daily Mass Readings for 2026

X