Tibenụ mkpu ọñụ n’ugwu Zion [Complete Hymn with Lyrics]
The hymn entitled ‘Tibenụ mkpu ọñụ n’ugwu Zion‘ is one of the popular Igbo Advent hymns or Igbo Christmas hymns which is used in Igbo Christian communities during worship. Catholic faithful use this hymn as one of the hymns for Mass and other liturgical celebrations. You will find below the lyrics of this hymn.
Tibenụ mkpu ọñụ n’ugwu Zion Lyrics
Intro: Tibenụ mkpu ọñụ n’ugwu Zion
Ụnụ ndị nke Chineke Tibenụ mkpu
Tibenụ mkpu n’ugwu Zion n’ugwu Zion.
Chorus: Tibenụ mkpu ọñụ, n’ugwu Zion
Ụnụ ndị nke Chineke, tibenụ mkpu
tibenụ mkpu ọñụ n’ugwu Zion, n’ugwu Zion
Buterenụ Chineke egwu, egwu otito n’ugwu dị nsọ
Ebe Ọ na-egosi ụwa afọma ya.
1. Biko nwanne m cheta chetakwa cheta o doo cheta na mkpụrụobi gị bụ ebe nsọ Chukwu, chetakwa nwanne m cheta, m chetakwa na arụ gị bụ akụkụ ụwa nke Chukwu na-achị. Biko nwanne m nyenụ Chukwu nsọpụrụ dị ebube, sekpuere ya, na ọbụ Chukwu ọkaka, gọzikwa aha nsọ ya. Wer’onwe gị nye Chukwu ọkaka welụ onwe gị nye Chukwu dị nsọ, Ọ ga-anarakwa gị dịka onwe ya. (ch:)
2. Tobenụ Chukwu Onye okike anyị, K’anyị too ya n’ime Mmụọ n’eziokwu toonụ ya. Tobenụ Chukwu Onye okike too ya, Tobenụ Chukwu onye okike k’anyị too ya, Tobenụ Chukwu onye okike tobenụ Dinwenụ Onye ker’ụwa chọọ ya mma. Tobenụ Chukwu Onye okike O, k’anyị too ya n’ugwu Zion.
3. Chineke, ọ bụ gị bụ Eze dị nsọ, O Chineke Ọkaka O Chineke mee K’íhé gị gosi anyị ụzọ nke nzọpụta. Makana ọlụ aka Chineke ebuka. Tibe mkpu ọñụ, ịdị ike bụkwa nke ya tibe mkpu ọñụ, Chineke e gosịgo onwe ya, tibe mkpu ọñụ. Otito dịkwara Mmụọ Nsọ, tibe mkpu ọñụ, otito dịrị ya ebebe, tibe mkpu ọñụ. Otito dịrị Ha ebebe, Otito dịrị ha ebebe.