Ekwe m n’otu Chineke [Complete Hymn with Lyrics]

The hymn entitled ‘Ekwe m n’otu Chineke‘ is one of the popular Igbo Catholic hymns which is used in Christian communities during worship. Catholic faithful use this hymn as one of the Holy Mass and other liturgical celebrations. You will find below the lyrics of this hymn.

Ekwe m n’otu Chineke Lyrics

s:s:l:s/m:-.d:-:-

Ekwe m n’otu Chineke,

Nna ji ike nile,

Onye mere eligwe na ala,

Na ihe dum a na-ahụ anya,

Na ndị anaghị ahụ anya,

Ya na otu Onyenweanyị, Jesu Kristi,

Sọ otu Nwa Chineke mụrụ:

Nna a mụrụ tupu ụwatụwa nile.

Chukwu si na Chukwu, íhé si na íhé

Ezi Chukwu si na ezi Chukwu.

A mụrụ ya amụ, e meghị eme,

Ya na Nna bụ otu ihe n’ihe ha ji bụrụ Chukwu,

Onye esi na Ya mee ihe dum.

Onye, maka ihi anyị bụ mmadụ,

Na maka ihi nzọpụta anyị, siri n’eligwe gbadata.

(Erunata isi ganye na erue na Ọ bụrụ Mmadụ)

O WERE AHỤ NA VIRGIN MARỊA SITE NA MMỤỌ NSỌ: Ọ BỤRỤ MMADỤ

A bịa kpọgbuo Ya n’obe n’ihi anyị

N’oge ọchịchị Pontius Pilate,

Ọ taa ahụhụ, Ọ nwụọ, E lie Ya.

Ma O bilitere n’ụbọchị nke atọ;

Ka Akwụkwọ-Nsọ si kwu.

Ọ rọgoro n’eligwe, nọrọ n’aka-nri Nna.

Ma Ọ ga-abịaghachi ọzọ n’ebube Ya

Ikpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe:

Onye ọchịchị Ya enweghị njedebe.

Ekwe m na Mmụọ Nsọ,

Onyenweanyị, na-enye ndụ:

Onye siri na Nna na Nwa pụta.

Onye a na-esekpuru, na etokọdo,

Ya na Nna na Nwa:

Onye si na Ndị Amụma kwuo okwu.

Ekwe m n’otu Nzukọ Nsọ Katọlik, na Apọstọlik.

Ekwupụta m otu Baptism nke mgbaghara njọ,

Ana m atụ anya mbilite n’ọnwụ ndị nwụrụ anwụ,

Na ndụ ụwa ga-abịanụ.

Other Catholic Igbo Common of the Mass Hymns

Other Catholic Hymns

Categorized in:

Catholic Hymns, Igbo Hymns,