Igbo Mass Readings for July 29 2024, Ncheta Martha dị Asọ

Igbo Mass Readings for July 29 2024, Ncheta Martha dị Asọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 29 2024, Ncheta Martha dị Asọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:7-16

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi mbụ nke Jọn

Ndị m hụrụ n’anya, ka anyị hụrịtanụ onwe anyị n’anya, n’ihina ịhụnaanya si na Chineke pụta. Onye ọbụla nwere ịhụnaanya bụ nwa nke Chukwu. Ọ makwaara Chukwu.

Onye na-enweghị ịhụnaanya amaghị Chukwu, n’ihina Chukwu bụ ịhụnaanya. Otu a ka ịhụnaanya Chineke si pụta ihe n’ebe anyị nọ, na o zitere naanị otu nwa ya n’ụwa ka anyị nwee ndụ site na ya.

N’ụdị a ka ịhụnaanya dị: Ọ bụghị na anyị ahụla Chineke n’anya, kama ọ hụrụ anyị n’anya ma zite nwa ya, ka ọ bụrụ onye a ga-esi n’aka ya gbaghara njọ anyị.

Ndị m hụrụ n’anya, ebe ọ bụ na Chineke hụrụ anyị n’anya otu a, anyị kwesịkwara ịhụrịta onwe anyị n’anya. O nwebeghị onye hụrụla Chineke. Ọ bụrụ na anyị hụrịta onwe anyị n’anya, Chineke na-anọgide n’ime anyị, ma na-emekwa ka ịhụnaanya ya zuo oke n’ime anyị.

Otu a ka anyị ga-esi mara na anyị bi n’ime ya, ya onwe ya ebiri n’ime anyị n’ihina o nyela anyị mmụọ ya. Anyị ahụla, na-agbakwa akaebe na Nna ezitela nwa ya ka ọ bụrụ onye nzọpụta nke ụwa.

Onye ọbụla na-ekwupụta na Jesu bụ nwa Chineke, Chineke na-ebi n’ime ya, ya onwe ya na-ebikwa n’ime Chineke. Anyị maara, ma kwerekwa n’ịhụnaanya Chineke nwere n’ebe anyị nọ.

Chineke bụ ịhụnaanya, onye ọbụla na-anọgide n’ịhụnaanya na-anọgide na Chineke, Chineke na-anọgidekwa n’ime ya.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 33: 2-3, 4-5, 6-7, 8-9, 10-11.

Azịza: Detụ ire ka ị hụ ka Onyenweanyị si dị mma

1. Aga m eto Onyenweanyị oge niile

Otito ya ga-adị n’egbugbere ọnụ m mgbe ọbụla

Mkpụrụobi m na-egori n’Onyenweanyị

Ka ndị umeala nụrụ ma ñụrịa. Azịza

2. Soronụ m kwupụta ịdịukwu nke Onyenweanyị

Soronụ m too aha ya

Akpọkuru m Onyenweanyị, Ọ za m

Ọ zọpụtara m n’egwu niile na-atụ m. Azịza

3. Ihu ọbụla chere n’ebe Onyenweanyị nọ na-amụke amụke

ihere anaghị eme ya ma ọlị

Onyenweanyị na-anụ mkpu akwa nwogbenye

Ọ na-enyekwara ya aka na nsogbu ya niile. Azịza

4. Mmụọọma nke Onyenweanyị na-eche ndị na-atụ ya egwu nche

Ọ na-azọpụta ha

Detụ ire ka ị hụ ka Onyenweanyị si dị mma

Añụrị na-adịrị onye gbabara n’Onyenweanyị. Azịza

5. Ụnụ ndị nsọ niile, tụọnụ Onyenweanyị egwu

n’ihina ndị niile na-atụ Onyenweanyị egwu enweghị ihe na-akpa ha

Agụụ nwere ike gụọ ụmụ ọdụm

mana iheọma anaghị akọ n’ebe ndị na-achọ Onyenweanyị nọ. Azịza

MBEKU

ALLELUIA, ALLELUIA:

Abụ m ihe nke ụwa, onye ọbụla na-eso m agaghị aga n’ọchịchịrị, kama ọ ga-enwe ihe nke ndụ.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 11: 19-27.

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere

Ọtụtụ ndị Juu bịara ka ha kasie Mata na Meri obi maka ọnwụ nwanne ha nwoke, Mgbe Mata nụrụ na Jesu na-abịa, ọ gara zute ya, ma Meri nọdụrụ n’ụlọ.

Mata gwara Jesu sị, “Onyenweanyị, ọ bụrụ na Ị nọ n’ebe a, nwanne m nwoke akaraghị ịnwụ. Ọ bụladị ugbu a, ama na Chineke ga-enye gị ihe ọbụla Ị rịọrọ n’aka ya.

Jesu gwara ya sị, Nwanne gị nwoke ga-ebili ọzọ. Mata aza sị ya, “Ama m na ọ ga-ebilite ọzọ na mbilite n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.” Jesu wee sị ya, “Abụ m mbilite n’ọnwụ na ndụ, onye ọbụla kwere na m ọbụladị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ.

Ma onye ọbụla nke dị ndụ, kwerekwa na m, agaghị anwụ ma ọlị. I kwere nke a?” Ọ zara Jesu sị, “Ee, Onyenweanyị, ekwere m na Ị bụ Kristi ahụ, nwa Chineke, onye nke ga-abịa n’ime ụwa.

MA Ọ BỤ

OZIỌMA – 10:38-42

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Mgbe ha na-aga n’ụzọ, Jesu banyere na otu ọnụmara. Otu nwaanyị a na-akpọ Mata nabatara ya n’ụlọ ya. Mata nwere nwanne nwaanyị a na-akpọ Meri, onye nọdụrụ ala n’ụkwụ Onyenweanyị na-anụrụ nkuzi ya.

Ma uche Mata gbasachara agbasa ebe ọ na-agba mbọ maka ile ọbịa. Ọ bịakwutere Jesu sị, “Onyenweanyị, ọ bụ na ometụghị gị n’obi na nwanne m nwaanyị hapụụrụ naanị m ije ozi niile?

Gwanụ ya ka ọ bịa nyere m aka.” Ma Onyenweanyị zara ya sị, “Mata, Mata, Ị na-echegbu onwe gị na-esogbukwa onwe gị n’ihi ọtụtụ ihe; ma otu ihe bụ ihe dị mkpa. Meri ahọrọla oke ka mma nke a na-agaghị anapụ ya.

Igbo Mass Readings for July 30 2024, Tuzde Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume

Igbo Mass Readings for July 29 2024, Ncheta Martha dị Asọ.

NEW! Catholic Sunday and Daily Mass Readings for 2026

X