Onyenwe m Chineke mee Ebere [Complete Hymn with Lyrics]
The hymn entitled ‘Onyenwe m Chineke mee Ebere‘ is one of the popular Catholic Igbo hymns which is used in Christian communities during worship. Catholic faithful use this hymn as one of the Holy Mass and other liturgical celebrations. You will find below the lyrics of this hymn.
Onyenwe m Chineke mee Ebere Lyrics
s:-:s:-/m:-:-:-/f:-:m:-/r:-:-:-/m:s:m:f/
r:-:-:-/s:-:r:f/m:-:-:d/l,:d:r:t,/d:-:-:-//
Chorus: Onyenwe m Chineke mee ebere zọpụta m n’ihi ebere gị.
1. Chukwu Nna biko ejila iwe bara m mba
Ezi Nna ejila ọnụma taa m ahụhụ.
2. Meere m ebere nna maka na ike adịghị m o
Zọọ m nna maka na ọkpụkpụ m na-ama jijiji.
3. Mmụọ m nọ na nnukwu nsogbu
Mana gịnwa Chukwu m, ọ bụ ole mgbe?
4. Tụgharịa Chineke zọpụta mkpụrụobi m
Zọọ m maka obi ebere gị maka na onweghị onye g’echeta gị n’ọnwụ.
Kedụ onye g’efe Chukwu N’ime ala mmụọ.
5. Akwa m n’ebe agwụla m ike.
Ụchịchị nile, elu akwa m abụrụ sọ anya mmiri
6. Ebego m akwa bekpọsịe anya m.
Akago m nka n’ịkpọ ndị irom,
ebe ndị iro na-agba m okirikiri.
7. Pụbaranụ mo ndị n’eme arụ maka na Chineke anụgo olu m.
Ọ natara ekpere m, onye nwe ụwa anatago arịrịọ m.
8. Ihere ejido ndị iro m, ha nọ na nnukwu nsogbu
Ha ga-alaghachi azụ, ọgba ha gharị na ntụmadị.
9. Otito dịrị Nna ji ike nile, Chukwu nna na nwa ya na mmụọ nsọ n’ụwa ebighịebi.
Other Catholic Igbo Common of the Mass Hymns
- Onyenweanyị mee Ebere
- Onyenwanyị mee Ebere
- Onyenweanyị mee Ebere
- Onyenweanyị biko mee Ebere
- Onyenwe m Chineke mee Ebere
- Otito dịrị Chineke na elu kasị elu
- Otito dịrị Chineke
- Ekwe m n’otu Chineke
- Ekwem na Otu Chineke
- Nsọ Nsọ Nsọ
- Nna Anyị nọ na Eligwe
- Nna Anyị nọ n’eluigwe
- Nna Anyị nọ na Eligwe
- Nwatụrụ nke Chukwu
- Nwatụrụ nke Chineke
- Nwatụrụ Chukwu
- Nwatụrụ Chineke Nwatụrụ Chukwu