ka Chineke wukwasịrị obodo ya,

Onyenweanyị hụrụ ọnụụzọama Zayọn n’anya,

karịa obodo niile dị na Jekọb.

A na-ekwu okwu otito banyere gị,

obodo nke Chineke.

Azịza: Ka mba niile too gị, O Chineke.

2. Aga m agụnye ljipt na Babịlọn na mba ndị kwere na m;

Aga m agụ ndị Taya, Filistia na Etiopia ka ndị Jerusalem.

Ha niile ga-akpọ Zayọn nne n’ihina a mụrụ ha niile na ya.

Ọ bụ onye kacha elu mere ya ihe ọ bụ!

Azịza: Ka mba niile too gị, O Chineke.

3. Ka Onyenweanyị na-edekọ aha mba niile n’akwụkwọ,

ị ga-agụnye ha ka ndị a mụrụ na Zayọn.

Ha na-agba egwu, na-ekwe ukwe na-asị:

“Na Zayọn ka ngọzi anyị niile siri bịa.”

Azịza: Ka mba niile too gị, O Chineke.

MBEKU

ALLELUIA ALLELUIA:

Atụrụ m na-anụ olu m, a makwaara m ha, ha na-esokwa m.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 10:22-30.

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.

Mgbe ahụ bụ oge emume nke ncheta nhunye ụlọnsọ n’aka Chineke na Jerusalem, bụrụkwa oge oyi. N’oge ahụ Jesu nọ na-ejegharị n’ụlọ nsọ, n’ịba Solomọn.

Ndị Juu gbara ya gburugburu na-ajụ ya sị, “Ruo ole mgbe ka ị ga-akwụba anyị obi n’elu? Ọ bụrụ na ị bụ Kristi, gwa anyị hoohaa.” Jesu azaa ha sị, “Agwala m ụnụ, ma ụnụ ekweghị.

Ọrụ ndị m na-arụ n’aha Nna m na-ekwupụta m. Ma ụnụ ekweghị n’ihina ụnụ esoghị na igwe atụrụ m. Atụrụ na-anụ olu m, a makwara m ha, ha na-esokwa m.

Ana m enye ha ndụ ebeebe, ha agaghị ala n’iyi ma ọlị. Ọ dịghịkwa onye ọbụla ga-apụrụ ha n’aka m. Nna m onye nyere m ha kachasị ihe niile, ọ dịghịkwa onye ọbụla pụrụ ịpụnara Nna m ihe n’aka. Mụ na Nna m bụ otu.

Igbo Mass Readings for May 14 2025, Emume Ncheta Matịas dị Asọ – Nwaazụ.

Igbo Mass Readings for May 13 2025, Tuzde Izuụka nke Anọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

Categorized in:

Igbo Mass Readings, Fourth Week of Easter - Igbo,

About the Author

Catholic Lectionary Founder & Editor

Catholic Lectionary is a website that makes available to you all the Catholic daily Mass readings (in English and Igbo languages) and reflections, daily prayers, Catholic hymns, and saints of the day. All these aim at collective growth in spiritual lives of all the Catholic faithful.

View All Posts

BEST SELLING! Catholic Sunday and Daily Mass Readings for 2025

X