Igbo Mass Readings for January 14 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge Adanyeghị n’Emume

Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 14 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:5-12

Ihe Ọgụgụ Ewetara N’akwụkwọozi E Degaara Ndị Hibru

Ọ bụghị ndị mmụọọma ka Chineke mere ka ha bụrụ ndị ga-achị ụwa ahụ ga-abịanụ bụ nke anyị na-ekwu maka ya. A gbaala akaebe ya n’otu ebe si, “Olee ihe mmadụ bụ nke na ị na-akpachapụrụ ya anya?

I mere ya ka ọ dị ala ntakịrị karịa ndị mmụọọma, I ji otito na nsọpụrụ kpuwe ya n’isi dịka okpueze, na etinyekwa ihe niile n’okpuru ya. “Ugbu a, n’itinye ihe niile n’okpuru ya, o nweghị ihe ọbụla nke ọ hapụrụ itinye n’okpuru ya. Ma otu ọ dị, anyị ahụbeghị ya ka ọ na-achị ihe niile.

Ma anyị na-ahụ Jesu, onye e mere ka ọ dị ala nwatakịrị oge karịa ndị mmụọọma ka e ji otito na nsọpụrụ kpuwe ya okpeze n’ihi ahụhụ nke ọnwụ, ka ọ bụrụ na site n’amara nke Chukwu ka o we nwụọ maka mmadụ niile.

N’ihina o kwesịrị ekwesi na onye ihe niile si n’aka ya dị, na onye ihe niile dị n’aka site n’ikpọbata ọtụtụ ụmụ Chineke n’otito ga-eme ka onye ndu nke nzọpụta ha zuo oke site n’ahụhụ.

N’ihina ma onye ahụ nke na-edo ha nsọ, ma ndị ahụ a na-edo nsọ, ha niile nwere otu mbido. Nke a mere ihere anapụghị ya ịkpọ ha ụmụnna, na-ekwu sị, “Aga m ekwupụta aha gị n’ebe ụmụnna m nọ, a gaa m eto gị n’etiti nke nzukọ”.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 8:2, 5, 6-7, 8-9.

Azịza: I mere Nwa Gị Nnaukwu ihe niile e kere eke, were ihe niile dobe n’okpuru ya.

1. Onyenweanyị Chineke anyị,

lee ka aha gị siri dị elu n’ụwa niile

Gịnị ka mmadụ bụ I ji eche echiche banyere ya

Nwa nke mmadụ na I na-eleta ya anya?

Azịza: I mere Nwa Gị Nnaukwu ihe niile e kere eke, were ihe niile dobe n’okpuru ya.

2. N’agbanyeghị, I mere ka o jiri

obere the karịa ndị mmụọọma nta,

I jikwa ugwu na nsọpụrụ chọọ ya mma dịka okpueze.

I mere ya nnaukwu ihe niile e kere eke were ịhe niile dobe n’okpuru ya.

Azịza: I mere Nwa Gị Nnaukwu ihe niile e kere eke, were ihe niile dobe n’okpuru ya.

3. Ọ na-achị ụmụatụrụ na ehi,

ya na ụmụanụọhịa ndịọzọ niile.

Ọ na-achị ụmụnnụnụ nke igwe, azụ dị na mmiri,

na anụ ndịọzọ dị n’osimiri.

Azịza: I mere Nwa Gị Nnaukwu ihe niile e kere eke, were ihe niile dobe n’okpuru ya.

MBEKU:

Alleluia, Alleluia:

Mee ka m ghọta ihe iso ụzọ gị pụtara, ka m wee nwee ike ịchịgharị ọrụ ịtụnaanya gị n’obi m.

Alleluia.

OZIỌMA – 1:21-28

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.

Mgbe Jesu na ndị na-eso ụzọ ya batara na Kapanaum, ọ banyere n’ụlọnzukọ ha ozigbo ahụ n’ụbọchị Sabat na-akụzi ihe. Nkụzi ya tụrụ ha n’anya, n’ihina ọ kụziiri ha ihe dịka onye nwere ikikere, ọ bụghị dịka ndiodeakwụkwọ ha.

Ozigbo ahụ, e nwere otu nwoke mmụọ ọjọọ ji n’ụlọnzukọ ahụ; onye nke tiri mkpu sị, “Gịnị ka anyị na gị nwekọrọ, Jesu onye Nazaret? Ị bịara ịla anyị n’iyi?

Ama m onye Ị bụ: Onye Nsọ nke Chineke”. Jesu gbọjara ya sị, “Mechie ọnụ, sikwa n’ime ya pụta”. Mmụọ ọjọọ ahụ mere ka ihe ọdụdọ dọọ ya, tikwaa mkpu n’olu ike, wee si n’ime ya pụta.

Ọrụ ebube ahụ juru mmadụ niile anya, nke mere ha jiri malite jụkọrịtaba onwe ha sị “Gịnị bụ nke a? Ọ bụ nkụzi ọhụrụ.

O ji ikikere na-enye ọ bụladị mmụọ ọjọọ iwu, ha wee na-erubere ya isi” Ngwangwa, akụkọ banyere ya wee gbasaa n’ebe niile, n’ala niile dị Galili gburugburu.

Igbo Mass Readings for January 15 2025, Wednezde n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for January 14 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Mbụ N’Oge Adanyeghị n’Emume.