Igbo Mass Readings for April 1 2026, Wenezde n’ime Izuụka dị Asọ

Igbo Mass Readings for April 1 2026, Wenezde n’ime Izuụka dị Asọ

Nke a bụ Igbo Mass Readings for April 1 2026, Wenezde n’ime Izuụka dị Asọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 50:4-9

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye amụma Aịzaya

Yahweh Chineke enyela m ire nke ndị azụrụ azụ ka m wee mara ka e si eji okwu agba onye ume dara mba ike. Ụtụtụ ọbụla, ọ na-akpọlite m, ka m nụrụ ihe, ka m gee ntị dịka onye a na-akụziri ihe.

Osebụrụwa Chineke emegheela ntị m, enupụghị m isi, alaghị m azụ. Enyere m ndị na-akụ m ihe azụ m, nye ndị na-adọ m aka n’ahụọnụ, agba m. Ezoghị m ihu m maka mkparị na asọ ha na-abụ m.

Maka na Osebụrụwa Chineke na-enyere m aka, ya mere, na-adaghị m mba. Edotere m ihu m ka okwute, ama m na ihere agaghị eme m. Onye na-agbara m aka ebe nọ nso.

Kedụ onye mụ na ya ga-ana aka? Kedụ onye bụ onyeiro m? Ya kpụdebe nso. Lee, Yahweh Chineke m na-enyere m aka, onye ga-ama m ikpe? Ha niile ga-erekacha ka uwe akịka tara.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 69:8-10, 21-22, 31, 33-34.

Azịza: Onyenweanyị zaa m na nnukwu ịhụnanya gị.

1. Ọ bụ maka gị ka m jiri na-edi mkparị,

nke na-eme m ihere,

nke na-eme ka m bụrụ onye ọbịa n’etiti ụmụnne m,

na-emekwa m onye mbịambịa n’ụmụnne m ndị ọzọ;

Inwe mmasị nke ụlọ gị eriela m obi,

mkparị nke ndị na akparị gị na-adakwasị m.

Azịza: Onyenweanyị zaa m na nnukwu ịhụnanya gị.

2. Mkparị agbawala obi m,

Echere m na m gaara enweta ntasịobi,

mana ahụghị m.

Ha nyere m nsi ka m rie,

mgbe agụụ gụrụ m,

mgbe akpịrị kpọrọ m nkụ,

ha nyere m mmanya gbakara agbaka ka m ñụọ.

Azịza: Onyenweanyị zaa m na nnukwu ịhụnanya gị.

3. Aga m eji ukwe too aha nke Chineke,

aga m eji ekele m bulie aha ya,

mgbe ahụ ndị umeala hụ nke a, ha ga-añụrị,

Ka ụnụ wee nwee ogologo ndụ ụnụ ndị na-achọ Chineke!

Onyenweanyị na-ege ndị niile nọ na mkpa ntị mgbe niile,

ọ naghị echezo ndị nke ya eji eji.

Azịza: Onyenweanyị zaa m na nnukwu ịhụnanya gị.

MBEKU

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

Ekele dịrị gị Eze anyị, onye rubeere Nna ya isi, Ọ naara ọnwụ ya n’elu obe dịka ezi nwatụrụ.

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

OZIỌMA – 26:14-25.

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.

Mgbe ahụ otu onye n’ime ụmụazụ iri na abụọ ahụ a na-akpọ Judas Izkarịọt jekwuru ndịisi nchụaja jụọ ha sị: “Gịnị ka ụnụ ga-enye m ma m rara ya nye ụnụ?”

Ha wee kwụọ ya iri ego ọlaọcha atọ. Bidozie n’oge ahụ gaba, Judas malitere chọba ụzọ ọ ga-esi rara ya nye. N’ụbọchị mbụ nke oriri Achịcha na-ekoghịeko ndị na-eso ụzọ Jesu bịakwutere ya jụọ ya sị: “Olee ebe ị ga-achọ ka anyị kwadooro gị maka oriri Ngabiga?”

Jesu sịrị ha: “Gakwurunụ otu nwoke n’ime obodo, gwanụ ya na onye nkuzi kwuru sị: ‘Oge m adịla nso, mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-eri oriri Ngabiga n’ụlọ gị.”

Ndị na-eso ụzọ ya mere ihe Jesu gwara ha. Ha wee kwadoo oriri Ngabiga. N’uhuruchi ya, ya na ndị ụmụazụ ya iri na abụọ ahụ nọ n’oche nri. Mgbe ha na-eri nri, Jesu sịrị ha, “Ana m agwa ụnụ eziokwu, otu onye n’ime ụnụ ga-arara m nye.”

Okwu a wutere ha nke ukwuu, ha wee malite jụba n’otu n’otu sị: “Onyenweanyị, ọ bụ m? Ọ zara sị: “Onye mụ na ya manyekọtara aka n’efere nri ga-arara m nye.

Nwa nke mmadụ na-ala dịka Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere ya. Ma ahụhụ ga-adịrị onye ahụ, onye a ga-esite n’aka ya rara nwa nke mmadụ nye. Ọ gaara akara ya mma ma a sị na a mụghị ya amụ.”

Judas onye ahụ rara ya nye jụrụ ya sị, “Ọ bụ m, Nnamukwu?” Ọ zara ya sị, “i kwuola ya na onwe gị.”

Igbo Mass Readings for April 2 2026, Ncheta Oriri Ikpeazụ (Tọọzde) MAOBU Chrism Mass

Igbo Mass Readings for April 1 2026, Wenezde n’ime Izuụka dị Asọ.

NEW! Catholic Sunday and Daily Mass Readings for 2026

X