Igbo Mass Readings for June 3 2024, Mọnde Izuụka nke Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 3 2024, Mọnde Izuụka nke Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:2-7

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọozi Pita nke Abụọ

Ka amara na udo dịrị ụnụ n’uju, site n’ịmata Chukwu na onye nzọpụta anyị Jesu Kristi. Site n’ike nke Chineke dị asọ e nyela anyị ihe niile dị anyị mkpa maka ibi ndụ na ịsọpụrụ Chineke.

O mere nke a site n’ime ka anyị mara onye ahụ nke kpọbatara anyị n’otito ya na ịdị mma ya. N’ụzọ dị otu a ka o si nyekwa anyị ọtụtụ ihe dị ukwuu, dịkwa okeọnụ nke o kwere anyị na nkwa.

O nyere ụnụ ha, ka ụnụ si na ha gbanahụ agụụ niile nke njọ dị n’ụwa, nke na-emebikwa mmadụ, ka ụnụ sorokwa ya keta oke n’ọdịdị ya dị asọ.

N’ihi nke a gbaanụ mbọ were omume ọma kwalite okwukwe ụnụ, werekwanụ amamihe kwalite omume ọma ụnụ. Werenụ ijide onwe ụnụ kwalite amamihe ụnụ.

Werekwanụ ịkwụdosiike kwalite ijide onwe ụnụ. Werenụ ịtụ egwu Chukwu kwalite ịkwụdosiike ụnụ. N’ikpeazụ werenụ obi nwanne kwalite ịtụ egwu Chineke ụnụ. Werekwanụ ịhụnaanya kwalite obi nwanne ụnụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 91: 1-2, 14-15, 15-16

Azịza: Chineke m, na ngị ka m tụkwasara obi m.

1. Onye bi na ndo nke onye kasị elu,

onye nọgidesiri ike na nchedo nke onyejiike niile,

ga-asị Onyenweanyị, Ị bụ onye nchedo m na ike m

Chineke m onye m tụkwasara obi! Azịza

2. Ebe ọ bụ na ọ gbakwutere m aga m azọpụta ya;

aga m echekwaba ya n’ihina ọ maara aha m.

Mgbe ọbụla ọ kpọkuru m aga m aza ya

aga m anọnyere ya n’oge nsogbu; Azịza

3. Aga m azọpụta ya nyekwa ya ugwu.

Aga m eji ogologo ndụ kwụọ ya ụgwọ

meekwa ya ka ọ hụ nzọpụta m. Azịza

MBEKU – Jemis 1:21

Alleluia, Alleluia:

Werenụ nwaayọ nara okwu ahụ nke a kụrụla n’obi ụnụ dịka mkpụrụ, nke pụrụ ịzọpụta mkpụrụobi ụnụ.

Alleluia.

OZIỌMA – 12:1-12

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Jesu malitere iji ụkabụilu gwa ndị isi nchụaja, ndị odeakwụkwọ, na ndị okenye okwu sị, “Otu nwoke kọrọ ugbo vaịn, gbaa ya ogige gburugburu gwuo olulu ebe ọ ga-echekọta mmanya a ga-apịpụta na mkpụrụ vaịn, wukwaa ụlọelu nche maka ubi ya.

O nyefere ya n’aka ndị nlekọta, gaa n’obodo ọzọ. Mgbe oge ịghọ mkpụrụ ruru, o zigaara ndị nlekọta ahụ otu nwodibo ya ka ọ nata ha oke nke ya n’ihe e wetara n’ugbo vaịn ahụ. Ma ndị nlekọta ubi ahụ jidere nwodibo ahụ, tie ya ihe, zilaa ya n’aka efu.

E mechaa, o zigakwa nwodibo ọzọ, ndị nlekọta ugbo vaịn ahụ a kụwaa ya isi, menye ya ihere. Onye nwe ugbo ahụ zitekwara nwodibo ya ọzọ, ha wee gbuo ya. Ha mesokwara ọtụtụ ụmụodibo ya otu aka ahụ, ụfọdụ ka ha tiri ihe, ụfọdụ ka ha gburu egbu.

Ọ ka nwere otu onye fọrọ nke ọ na-ezitebeghị, bụ nwa ya nwoke ọ hụrụ n’anya. N’ikpeazụ o zigaara ha nwa ya nwoke, chee sị: Ha ga-asọpụrụ nwa m nwoke. Ma ndị nlekọta ahụ kwurịtara n’etiti onwe ha sị, “Leenụ onye ga-eketa akụnụụba nna ya, bịanụ ka anyị gbuo ya, ka ihe niile a bụrụ nke anyị.

Ha wee jide ya, gbuo ya ma tụpụ ozu ya n’ugbo vaịn ahụ. Jesu ajụọ ha sị, “Gịnị ka onye nwe ugbo vaịn ahụ ga-eme? Ọ ga ebibi ndị nlekọta ubi ahụ, werekwa ugbo ya nyefee n’aka ndị ọzọ.

Ọ bụ na ụnụ agụbeghị ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ: Okwute ahụ nke ndị na-arụ ụlọ jụrụ ajụ abụrụla ide ji ụlọ.

Nke a bụ ọrụ nke Dinwenụ ọ dị ịtụnaanya n’anya anyị”. Ha kaara ijide ya n’ihina ha chọpụtara na ọ kọrọ akụkọ ụkabụilu a megide ha. Ma n’ihina ha na-atụ igwe mmadụ ahụ egwu, ha hapụrụ ya ma pụọ.

Igbo Mass Readings for June 4 2024, Tuzde Izuụka nke Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for June 3 2024, Mọnde Izuụka nke Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 9, 2022