Igbo Mass Readings for February 1 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 1 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 11:1-2, 8-19

Ihe Ọgụgụ Ewetara N’akwụkwọozi E Degaara Ndị Hibru

Okwukwe bụ mmasịobiike banyere ihe ndị a na-ele anya ha, ihe ndị were anya na ha dị ma a hụghị ha anya. Ọ bụ site n’okwukwe ka ndị mgbe ochie ji nata nkwado, dị asọ. Site n’okwukwe, Abraham rebere isi mgbe a kpọrọ ya ka ọ hapụ obodo ya gaa n’ala ahụ nke ọ ga-enweta dịka ihe nrite.

Ọ gabara na-amaghị ebe ọ na-aga. Okwukwe ka o ji biri dịka ọbịa n’ala ahụ nke Chineke kwere ya na nkwa. Ya na Aịzik na Jekọb bụ ndị Chineke kwere ya na ha otu nkwa ahụ, biri n’ụlọikwu.

Ọ tụrụ anya maka obodo ahụ nke nwere ntọala, nke Chineke bụ onye rụrụ ya na onye mere ya. Site n’okwukwe, Sera n’onwe ya nwetara ike ịtụrụ ime ọ bụladị mgbe oge ịmụ nwa ya gafechara.

Nke a mere n’ihina ọ chọpụtara na onye ahụ kwere ya nkwa kwesịrị ntụkwasịobi. Ọ bụ ezie na Abraham mechara nwụọ, ma e sitere n’agbụrụ ya bụ otu nwoke mụta ọtụtụ ụmụ, ndị bara ụba dịka kpakpando nke eluigwe, nke a na-enweghị ike ịgụta ọnụ dịka aja dị n’ikpere osimiri.

Ndị a niile nwụrụ n’ime okwukwe n’anataghị ihe e kwere ha na nkwa, ma ha siri ebe dị anya hụ ya, ma kelee ya. Ha nabatara na ha bụ ndị ọbịa na ndị ije n’elu ụwa. Ndị na-ekwu ihe dị otu a mere ka ọ pụta ihe na ha na-achọ ala nke ha.

Ọ bụrụ na ha na-eche banyere ala nke ha si na ya pụọ, ha gaara enwe ohere ịlaghachi azụ. Ma otu o si dị, ha na-achọ obodo ka mma bụ nke eluigwe. Ya bụ, ihere anaghị eme Chineke ịza Chineke ha, n’ihina ọ kwadooro ha obodo mara mma.

Site n’okwukwe Abraham ji Aịzik chụọ aja mgbe Chineke nwalere ya. Onye ahụ natara ihe ndị ahụ e kwere na nkwa dị njikere iji sọ otu nwa ya ahụ chụọ aja, onye e kwuru maka ya sị, “Site na Aịzik ka agbụrụ gị ga-esi nweta aha”.

Abraham chere na Chineke nwere ike isi n’ọnwụ kpọlite ndị nwụrụ anwụ. Ya bụ, ọ dịka e nyeghachikwara ya Aịzik ọzọ. Nke a bụ ihe ngosị.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Lk 1:69-70, 71-72, 73-75

Azịza: Ngọzi dịrị Dinwenụ Chineke nke Izrel, makana ọ bịara leta ma zọpụtakwa ndị nke ya.

1. O weliterela anyị onyenzọpụta

Site n’agbụrụ Devid, nwodibo ya,

Otu o siri kwuo n’oge ochie,

Site n’ọnụ ndị amụma ya.

Azịza: Ngọzi dịrị Dinwenụ Chineke nke Izrel, makana ọ bịara leta ma zọpụtakwa ndị nke ya.

2. Na a ga-azọpụta anyị site n’aka ndịiro anyị

Na sitekwa n’aka ndị niile kpọrọ anyị asị

O gosịrị nnanna anyị ha ebere

Bịa chetakwa ọgbụgbandụ ya dị nsọ.

Azịza: Ngọzi dịrị Dinwenụ Chineke nke Izrel, makana ọ bịara leta ma zọpụtakwa ndị nke ya.

3. Ọ ñụụrụ nnanna anyị bụ Abraham iyi

Kwekwa nkwa na ya ga-azọpụta anyị n’aka ndịiro anyị

K’anyị nwee ike n’ekpere ya n’atụghị egwu ọbụla       

N’ịdị nsọ na eziomume n’ihu ya, ụbọchị niile nke ndụ anyị.

Azịza: Ngọzi dịrị Dinwenụ Chineke nke Izrel, makana ọ bịara leta ma zọpụtakwa ndị nke ya.

MBEKU – Ps. 111:8

Alleluia, Alleluia:

Onyenweanyị, Iwu gị dị ntụkwasịobi n’ụzọ niile. Nke a mere ka ọdị ebeebe ebeebe.

Alleluia

OZIỌMA – 4:35-41

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

N’ụbọchị ahụ, n’oge mgbede, Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ka anyị gafeenụ n’akụkụ nke ọzọ.” Ha hapụrụ igwe mmadụ ahụ, gakwuru Jesu n’ụgbọ, kwọrọ ya gafee. Ụgbọmmiri ndị ọzọ nọkwa n’ọnụ mmiri ahụ.

Oke ifufe febere, ebili mmiri malitekwara wụbawa n’ime ụgbọ nke mere ka mmiri jupụta n’ime ya. Ma Jesu n’onwe ya nọ n’isi ụgbọ na-arahụ ụra n’elu ihe nhibe isi, ha kpotere ya wee sị ya, “Onyenkụzi, ọ bụ na o metụghị gị n’obi na anyị na-ala n’iyi?”

Jesu wee bilie, bigbọọ oke ifufe ahụ, sịkwa osimiri ahụ, “kwụsị! Dere jụụ!” Oke ifufe ahụ kwụsịrị, oke ndajụ wee dị. Ọ jụrụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Gịnị mere ụnụ ji atụ egwu?

Ọ bụ ụnụ enweghị okwukwe?” Oke egwu jidere mmadụ niile, ha wee jụkọrịtaba onwe ha sị, “Onye bụ onye a, nke na ifufe na oke osimiri na erubere ya isi?”

Igbo Mass Readings for February 2 2025, Emume Nkubata Dinwenụ Jesu Krist N’Ụlọ Nsọ

Igbo Mass Readings for February 1 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.