1. Echere m, echere m Onyenweanyị,
O wee hulata gee m ntị, nụrụ akwa enyemaka m
na-ebe O tinyere ukwe ọhụrụ n’ọnụ m,
otito nke Chukwu anyị.
Azịza: Anọ m ebe a, Dinwenụ; abịara m ime uche gị
2. Ị naghị achọ ịchụ aja mọbụ ihe nrunye,
kama ntị ghe oghe.
Ị naghị achọ aja nsureọkụ mọbụ aja maka njo,
kama e kwuru m sị, “Anọ m ebe a, ana m abịa.”
Azịza: Anọ m ebe a, Dinwenụ; abịara m ime uche gị
3. Ekwupụtala m eziomume nke Onyenweanyị
na nnukwu ọgbakọ
Lee, emechighị m ọnụ m,
ị maara nke a O Onyenweanyị.
Azịza: Anọ m ebe a, Dinwenụ; abịara m ime uche gị
4. O nwebeghị mgbe m jụrụ ikwupụta eziomume gị.
kama ekwupụtala m nkwụdosiike na enyemaka nzọpụta gị.
Ahapụbeghị m ikwupụta ịhụnaanya na nkwụdosiike gị
n’ihu nnukwu ọgbakọ.
Azịza: Anọ m ebe a, Dinwenụ; abịara m ime uche gị
Alleluia, Alleluia.
Ekwela ka ma soro ụzọ na-akwụghị ọtọ, ma nye m amara nke iwu gị.
Alleluia.
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Nne Jesu na ụmụnne ya bịara guzoro n’ezi, zie ozi ka a kpọọ ya. Igwe mmadụ gbakwara ya gburugburu. Ụfọdụ n’ime ha gwara ya sị, “Nne gị na ụmụnne gị nọ n’ezi na-achọ gị”.
Ma ọ zara ha sị, “Onye bụ nne m na ụmụnne m? O lechara ndị gbara ya gburugburu anya sị, “Ndị a bụ nne m na ụmụnne m! Onye ọbụla na-eme uche Chineke bụ nwanne m nwoke, nwanne m nwaanyị na nne m”.
Igbo Mass Readings for January 29 2025, Wednezde n’ime Izuụka nke Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for January 28 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.