Igbo Mass Readings for October 20 2026, Tuzde Izuụka nke Iri Abụọ na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 20 2026, Tuzde Izuụka nke Iri Abụọ na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:12-22
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Efesọs
Chetanụ mgbe e kewapụrụ ụnụ na Kristi. E kewapụtakwara ụnụ site na mmekọrịta nke Izrel, bụrụkwa ndị ọbịa n’ọgbụgbandụ ahụ, na-enweghị olileanya na na-enwekwaghị Chineke, n’ime ụwa.
Ugbu a n’ime Jesu Kristi, ụnụ bụ ndị nọbu n’ebe dị anya ka e wedeberela nso n’ime ọbara Kristi. Ya bụ udo anyị, onye merela anyị ka anyị bụrụ otu ma kwatuokwa mgbidi nkewa nke na-eweta iro.
O sitere n’ahụ ya weta n’isi njedebe, iwu na atụmaatụ nke ndị Juu, ka o wee jiri mmadụ abụọ ahụ mepụta otu mmadụ ọhụrụ n’ime onwe ya si n’ụzọ dị otu a na-eme ka udo dị.
N’ụzọ dị otu a ka ọ ga-esi kpeziere anyị na Chineke site n’obe ya, wetakwa n’isi njedebe iro dị n’etiti ha abụọ. Ọ bịakwara kwusaara ụnụ ndị nọ ebe dị anya na ụnụ ndị nọ nso, oziọma nke udo.
Ọ bụ site na ya ka anyị ji nwee ike n’ime otu mmụọ ahụ, ịbịakwute Na. Ya bụ ụnụ esorola ndị nsọ bụrụ ndị a mụrụ n’ala, n’ezinụụlọ Chineke; nke a rụkwasara n’elu ntọala nke ụmụazụ na ndịamụma, nke Jesu Kristi n’onwe ya bụ okwute ntọala ya.
Ọ bụ n’ime ya ka ihe ndị a niile jikọtara ọnụ, too, wee bụrụ ụlọnsọ n’ime Dinwenụ. N’ime ya ka a rụnyekwara ụnụ dịka ebe obibi nke Chineke n’ime mmụọ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 85:8,10-11, 12-13
Azịza: Onyenweanyị na-ekwu okwu udo maka ndị nke ya
1. Ana m ege ntị n’ihe Chineke, Onyenweanyị na-ekwu,
ihe ọ na-ekwu bụ udo maka ndị nke ya,
n’ezie nzọpụta ya dị nso maka ndị na-atụrụ ya egwu,
ka ebube ya wee nọgide n’ala anyị.
Azịza: Onyenweanyị na-ekwu okwu udo maka ndị nke ya
2. Ịhụnaanya na okwukwe amakụọla,
eziomume na udo ebiela ọma
Irubeisi ga-esi n’ala pulite,
eziomume ga-esi n’elu ledata anya.
Azịza: Onyenweanyị na-ekwu okwu udo maka ndị nke ya
3. Ee Onyenweanyị ga-enye anyị ọganiihu,
ala anyị ga-amịta mkpụrụ bawanye.
Eziomume ga-aga n’ihu ya
udo ga na-eso nzọ ụkwụ ya.
Azịza: Onyenweanyị na-ekwu okwu udo maka ndị nke ya
MBEKU – Jọn 6:64, 69.
Alleluịa, Alleluịa:
Onyenweanyị, okwu gị bụ mmụọ bụrụkwa ndụ. Ọ bụ gị ji okwu nke ndụ ebeebe.
Alleluịa.
OZIỌMA – 12:35-38
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Keenụ aji n’ume, ka ọkụ ụnụ na-enwukwa, dịkwanụ ka ndị na-eche nna ha ukwu mgbe ọ ga-esi n’oriri agbamakwụkwọ lọta, ka ha wee meghere ya ụzọ ngwangwa mgbe ọbụla ọ ga-alaghachi kụọ aka.
Ngọzi ga-adịrị ụmụodibo ahụ ndị nna ha ukwu ga-ahụ ka ha mụ anya mgbe ọ bịara; n’ezie agwa m ụnụ, ọ ga-eke akwa n’ukwu, mee ka ha nọdụ n’oche nri, bịa gbaara ha odibo.
Ọ bụrụ na ọ ga-abịa na nche nke abụọ mọbụ na nke atọ n’isi ụtụtụ hụ ha ka ha nọ na nche, ngọzi ga-adịrị ụmụodibo ahụ.”
Igbo Mass Readings for October 20 2026, Tuzde Izuụka nke Iri Abụọ na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.