Igbo Mass Readings for July 15 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 15 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:1-5
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ọpụpụ
N’oge ahụ otu nwoke si n’agbụrụ Levaị gara lụrụ otu nwaada sikwa n’agbụru Levaị. Nwaanyị a tụụrụ ime, mụta nwa nwoke, mgbe ọ hụrụ ka nwata ahụ siri maa mma nke ukwuu, o zobere ya ọnwa atọ.
Ka ọ hụrụ na o nweghịkwa ka ọ ga-esi zobe ya bụ nwa ọzọ, o tinyere ya na nkata e jiri etere ete mmanụ korota wee mechisie oghere ya dote ya n’etiti ahịhịa miri dị n’akụkụ osimiri Naịl.
Nwanne ya nwaanyị guzoro ebe dị anya ịmata ihe ga-eme ya. Mgbe ada Fero bịara ịsa ahụ n’osimiri Naịl, ma ụmụodibo ya nwaanyị nọ na-agagharị n’akụkụ osimiri ahụ, ọ hụrụ nkata dọ n’etiti obere ọhịa dị n’agịga mmiri wee zie otu odibo ya nwaanyị ka ọ gaa bute ya.
Mgbe o kpughere nkata ahụ, lee, nwa nọ n’ime ya na-akwa akwa. Ebere nwatakịrị ahụ mere ya o wee sị, “Nke a bụ otu n’ime ụmụ ndị Hibru”.
Ozigbo, nwanne nwaanyị nwantakịrị ahụ pụtara jụọ ada Fero sị, “Ọ bụ m gaa kpọọrọ gị otu nwaanyị onye Hibru ga-enyere gị aka zụọ nwa a?” Ada Fero zara ya sị, “Gaba”.
Nke a mere nwata nwaanyị ahụ jiri ga-kpọọ nne nwa ahụ. Ada Fero wee gwa nne nwa ahụ sị, “Kuru nwa a gaa zụwara m ya, aga m akwụ gị ụgwọ ọrụ gị”. Nwaanyị a wee kuru obere nwa ahụ gaa zụọ ya.
Oge nwa ahụ topụtara, o kuteere ya ada Fero onye jiri ya mere nwa nwoke. Ọ gụrụ ya Mosis makana o kwuru sị, “Esi m n’osimiri gụpụta ya”.
Otu ụbọchị mgbe Mosis topụtarala okorobịa, ọ gara ileta ụmụnne ya, wee hụ ka ha siri nọrọ n’ime ahụhụ. Ọ hụrụ otu onye Ijipt ka ọ na eti otu nwanne ya onye Hibru ihe.
O legharịrị anya gburugburu. Mgbe ọ hụrụ na o nweghị onye na-ele anya, o gburu onye ljipt ahụ lie ya n’aja. Ka ọ pụrụ echi ya, ọ hụrụ ndị Hibru abụọ ka ha na-alụ ọgụ.
Ọ jụrụ onye nke chọrọ okwu sị, “Gịnị mere i ji etigbu nwanne gị?” Ọ zara ya sị, “Onye mere gị onye ọchịchị na onye ọkaikpe n’etiti anyị? Ị chọwala igbu m otu i si gbuo onye ljipt?”
Ozigbo egwu jidere Mosis, o wee chee n’ime onwe ya sị, ‘N’ezie ihe a apụtala ihe’ Mgbe Fero nụrụ nke a ọ chọrọ igbu Mosis, ma Mosis gbapụrụ ga biri n’ala Midian. Ọ nọdụrụ ala n’akụkụ olulu mmiri nke dị n’ebe ahụ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 69:3, 14, 30-31, 33-34
Azịza: Ka ụnụ nwee ogologo ndụ, ụnụ ndị na-achọ Chineke.
1. Ana m emikpu n’ime ude mmiri
N’enweghị ebe m ga-azọkwasị ụkwụ;
Adamiela m n’ime ụmị mmiri,
Ebili mmiri na-eburu m.
Azịza: Ka ụnụ nwee ogologo ndụ, ụnụ ndị na-achọ Chineke.
2. Ana m arịọ gị, Onyenwe m,
Oge masịrị gị
n’oke ịhụnanya gị, za m
N’ịkwụsiike nke nzọpụta gị.
Azịza: Ka ụnụ nwee ogologo ndụ, ụnụ ndị na-achọ Chineke.
3. Ma, n’ebe m nọ, nwa ogbenye a na-emegbu emegbu,
Site n’ike nke nzọpụta gị, Chineke, kulite m elu
Aga m eji ukwe too aha nke Chineke
Aga m eji ekele m bulie aha ya.
Azịza: Ka ụnụ nwee ogologo ndụ, ụnụ ndị na-achọ Chineke.
4. Mgbe ahụ ndị umeala hụ nke a, ha ga-añụrị
Ka ụnụ wee nwee ogologo ndụ, ụnụ ndị na-achọ Chineke
Onyenweanyị na-ege ndị niile nọ na mkpa ntị mgbe niile,
ọ naghị echezọ ndị nke ya e ji e ji.
Azịza: Ka ụnụ nwee ogologo ndụ, ụnụ ndị na-achọ Chineke.
MBEKU – Ọrụ Ndiozi 16:14
Alleluia, Alleluia:
Onyenweanyị meeghe obi anyị ka anyị gee ntị n’ihe niile nwa gị na-ekwu.
Alleluia.
OZIỌMA – 11:20-24
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Mgbe ahụ, Jesu malitere ịbara obodo niile ebe ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube mba, n’ihina ha echegharịghị. Azị gba ụnụ Korazin, azị gba ụnụ Betsaịda!
N’ihina a sị na ọ bụ n’ime obodo Taya na Sidọn ka a rụrụ ọrụ ebube niile a rụrụ n’ime ụnụ, ha gaara echegharị kamgbe site n’iyiri akwa mkpe na ite onwe ha ntụ.
Ma agwa m ụnụ, “a ga-emere obodo Taya na Sidọn ebere n’ụbọchị ikpe karịa ụnụ. Ma gị Kapanaum, a ga ebuli gị ruo eluigwe?
A ga-eweda gị ruo olulu ala mmụọ. N’ihina a sị na ọrụ ebube niile a rụrụ n’ime gị, na a rụrụ ha na Sodọm, ọ gaara adị ruo ugbu a. Agwa m ụnụ, a ga-emere obodo Sodọm ebere n’ụbọchị ikpe karịa ụnụ.
Igbo Mass Readings for July 16 2025, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for July 15 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.