Igbo Mass Readings for June 22 2025, Ụka Ahụ na Ọbara Kristi – Afọ nke Atọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 22 2025, Ụka Ahụ na Ọbara Kristi – Afọ nke Atọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 14:18-20
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Jenesis
Isi Okwu: O wetara achịcha na mmanya.
Melkizedek, eze Salem, wetara achịcha na mmanya, Ebe, ọ bụ Ụkọchukwu nke Chineke Kacha Elu, o jiri okwu ndị a gọzie Ebram: “Ngọzi nke Chineke Kacha Elu, Onye kere eluigwe na ụwa, dịrị Ebram.
Ngọzi dịrị Chineke Kacha Elu, Onye weere ndị iro gị tinye gị n’aka.” Ebram nyere Melkizedek onyinye otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe niile ọ dọtara n’agha.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 109:1, 2, 3, 4. Az. 4
Azịza: Ị bụ Ụkọchukwu ebighị ebi n’usoro nke Melkizedek.
1. Onyenweanyị gwara Nna m ukwu:
“Nọdụ ala n’aka nri m,
wee ruo mgbe m mere ka ndị iro Gị bụụrụ Gị ihe mgbakwasa ụkwụ. Azịza.
2. Onyenweanyị ga-esi na Zayọn sepụta mkpara eze I ji eme ọgụ.
Chịba ọchịchị n’etiti ndị iro gị. Azịza.
3. Site n’ụbọchị a mụrụ Gị n’ebube nsọ, Ị bụ nwa eze.
Amụpụtara m gị dịka igirigi tupu chi ọbụbọ. Azịza.
4. Onyenweanyị añụọla iyi.
Nñụghasị adịghịkwa ya.
“Ị bụ Ụkọchukwu ebighị ebi,
n’usoro nke Melkizedek. Azịza.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 11:23-26
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mbụ Pọl dị asọ degaara ndị Kọrịnt
Isi Okwu: Mgbe ọ bụla ụnụ na-eri achịcha na-añụ iko a, ụnụ na-ekwusa ọnwụ Onyenweanyị.
Ihe m natara n’aka Onyenweanyị ka m nyefere ụnụ n’aka. Nke bụ na, n’abalị ahụ a raara Onyenweanyị Jesu nye n’aka ndị iro Ya, O weere achịcha. Mgbe O kelesịrị Chineke ekele, Ọ nyawaa ya, sị: “Nke a bụ ahụ M, nke a na-enye n’ihi ụnụ.
Na-emenụ nke a na ncheta nke M”. Mgbe ha risịrị nri anyasị, Ọ narakwa iko otu aka ahụ sị: “Iko a bụ iko Ọgbụgba Ndụ Ọhụrụ n’ime ọbara M. Mgbe ọ bụla ụnụ na-añụ ya, na-emenụ ya na ncheta nke M”.
N’ihi na mgbe ọ bụla ụnụ na-eri achịcha nke a, na-añụkwa iko nke a, ụnụ na-ekwusa ọnwụ nke Onyenweanyị ruo mgbe Ọ ga-abịa ọzọ.
UKWE ỌMA: ZAYỌN TOO ONYE NZỌPỤTA GỊ
(1) Zayọn too Onye Nzọpụta gị,
Toonụ Onye eze na Onye nche atụrụ
Kweenụ ukwe, bụbanụ abụ.
(2) Toonụ Ya, too Ya, toosienụ Ya ike
Ọ karịrị otito ụnụ nwere ike inye
Otito ụnụ agaghị ezuru Ya.
(3) Otu ihe pụrụ iche anyị ji eto Ya
Bụ achịcha nke ndụ maka ndị dị ndụ
Nke O debeere anyị n’ụbọchị taa.
(4) N’oriri ikpeazụ ka O ji aka Ya
Nyefee oriri nsọ n’aka Ụmụazụ Ya,
Ka a ghara inwe ihe ịrụ ụka ọ bụla
(5) Werenụ mkpu ọñụ toosienụ Ya ike,
Werenụ añụrị doo Ya ebube,
Were obi ụtọ tie mkpu ọñụ.
(6) Taa bụụrụ anyị nnukwu emume,
Anyị na-echeta ụbọchị mbụ ahụ,
Mgbe O nyere anyị ihe omimi nke a.
(7) N’ihe omimi nke a, Eze agba ọhụrụ,
Jiri oriri nsọ hibe iwu ọhụrụ,
Nke melara aja agba ochie.
(8) Iwu ọhụrụ anọchiela anya iwu ochie,
Eziokwu achụọla onyinyo ọsọ,
Ihe achụsaala ọchịchịrị.
(9) Ihe ahụ Kristi mere na nri ikpeazụ
Ọ bụkwa ya ka anyị na-eme ugbu a,
A ga na-eme ya na ncheta nke Ya.
(10) N’usoro ntọala nsọ I kuziiri anyị,
Ka anyị ji achụnyere Gị aja nke a,
Achịcha na mmanya nke nzọpụta.
(11) Iwu ji onye otu Kristi ọ bụla,
Ikwere na achịcha bụ ahụ Kristi,
Na mmanya bụ ọbara Kristi.
(12) Uche apụghị ịghọta ya, anya apụghị ịhụ Ya,
Ma okwukwe gwara anyị na ọ bụ ezie,
Eziokwu nke si n’igwe.
(13) Ọ bụghị achịcha na mmanya ka a hụrụ,
Kama n’okpuru nke ọ bụla n’ime ha,
Akara dị egwu zoro n’ime ya.
(14) Kristi nọzuru oke na nke ọ bụla,
Ahụ Ya bụ ezigbo ihe oriri,
Ọ bara ya bụ ihe ọñụñụ.
(15) N’oriri, nke ọ bụla a natara,
Kristi zuru oke n’ibe ọ bụla,
N’ebughị ọrụ n’enweghị nkewa.
(16) Ihe onye natara, ka ibe ya natara,
Nnụ kwuru nnụ dị ka otu onye,
E richaa, ọ fọkwara.
(17) Ndị ọma natara ihe ndị ọjọọ natara,
Ma n’ọpụpụ ha, ọ bụghị otu ihe,
Ndị a natara ndụ, ndị ọzọ natara ọnwụ.
(18) Ụwa hụrụ ya ka otu oriri ahụ,
Ọpụpụ abụghịkwa otu ihe ma ọlị,
Ọnwụ jọrọ njọ, ma ndụ mara mma.
(19) A rụkwala ụka, chetakwa na
Mgbe a nyawara ogbe achịcha ọ bụla,
Kristi nọzuru n’ibe nke ọ bụla.
(20) E nweghị ihe ọ bụla na-ekewa Kristi;
A nyawaa achịcha, a nyawaghị Kristi,
O zuru oke n’ibe nke ọ bụla,
O nweghị ihe e bepụrụ na Kristi.
(21) Lee Achịcha Nke Ndị Mmụọma
E mere nri nke ndị nọ n’ije,
Ezigbo nri nke ụmụ Chukwu,
A tụpụkwarala ya nkịta.
(22) Ọ bụ ihe a ka e ziri n’akara
Mgbe e jiri Aịzik chụọ aja
Mgbe e gburu Nwatụrụ Ngabiga
N’achịcha igwe e nyere nna anyị ha.
(23) Jesu ezigbo nri na Onye nche atụrụ,
N’ebere Gị, zụọ anyị lekwaba anyị,
Mee ka anyị hụ ihe ọma Gị,
N’ala ndị dị ndụ.
(24) Ọ bụ sọ Gị ma ihe niile bara uru,
Nke e ji azụ anyị n’ụwa nke a.
Ka anyị rikọọ bụrụ otu n’igwe,
Wee keta oke ụmụ n’obodo nsọ.
MBEKU – Jọn. 6:51-52
Aleluya, aleluya!
Onyenweanyị kwuru sị: Abụ M achịcha dị ndụ, nke si n’igwe gbadata. Onye ọ bụla riri achịcha nke a, ga-adị ndụ ebighị ebi.
Aleluya!
OZIỌMA – 9:11-17
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Isi Okwu: Jesu wee zụọ puku mmadụ ise
Jesu naara igwe mmadụ ahụ nke ọma, gwa ha okwu maka Alaeze Chineke. Ọ gwọkwara ndị niile ọ dị mkpa ka e mee ka ahụ dị ha ike. Ma mgbe chi malitere iji, Ụmụazụ Ya iri na abụọ ahụ wee bịakwute ya, sị: “Zilaa igwe mmadụ ndị a ka ha gaa n’ime obodo nta niile, na ebe niile mmadụ bi n’ala ubi dị gburugburu, chọta ihe oriri na ebe ha ga-edina n’abalị, n’ihi na ndị mmadụ ebighị n’ebe a anyị nọ.
Ma Jesu sịrị ha: “Ụnụ onwe ụnụ, chọọrọnụ ha nri ha ga-eri”! Ha wee zaa sị: “Ihe anyị nwere ebe a bụ naanị ogbe achịcha ise na azụ nta abụọ. Ị chọrọ ka anyị gaa zụta ihe oriri ga-ezu mmadụ niile ndị a?
Ndị mmadụ nọ ebe ahụ ruru puku mmadụ ise. Jesu wee sị Ụmụazụ ya: Gwanụ ha ka ha nọdụ ala. Keenụ ha, ka ha nọdụ n’igwe n’igwe, iri mmadụ ise, iri mmadụ ise.
Ụmụazụ Ya wee mee otu ahụ, wee mee ka ha niile nọdụ ala. Jesu wee nara ogbe achịcha ise na azụ nta abụọ ahụ, lee anya n’eluigwe, gọzie ha, nyawaa ha, nye Ụmụazụ Ya ka ha kesaara igwe mmadụ ahụ. Ha niile wee rie, rijukwaa afọ. Ụmụazụ Ya tụtụkọrọ iberibe fọdụrụnụ, wee tụtụjuo nkata iri na abụọ.
Igbo Mass Readings for June 23 2025,
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. If you donate just ₦2000, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.