Igbo Mass Readings for June 18 2025, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 18 2025, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 9:6-11
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke abụọ Pọl Degaara ndị Kọrịnt
Isi okwu bụ nke a: mkpụrụ onye kụrụ ka ọ ga-aghọta. Onye kụrụ nwantịntị ga-aghọta nwantịntị. Onye kụrụ n’uju ga-aghọtakwa n’uju. Onye ọbụla ga-enye dịka o kpebiri n’obi ya.
Ụnụ enyela na mwute na n’inwe obi abụọ, mọbụ dịka a manyere ụnụ amanye, n’ihina Chineke na-ahụ onye ji obi ụtọ enye onyinye n’anya.
Chineke, n’onwe ya, pụrụ ibutere ụnụ ngọzi n’uju, karịa ka ụnụ tụrụ anya. Ọ pụrụ ime ka ụnụ nwezuo ihe niile na-akpa ụnụ nwekwaa nke fọdụrụ maka ezi ọrụ niile.
Otu a ka e dere n’Akwụkwọ Nsọ sị: “O kesara akụ ya, o nyere ụmụogbenye ihe, obiọma ya na-adịgide ruo mgbe ebighịebi”.
Chineke, onye na-enye onye ọrụubi mkpụrụ ọkụkụ na ihe oriri ga-enyekwa ụnụ mkpụrụ mọbụ ihe ụnụ ji arụ ọrụ obiọma. Ọ ga-eme ka ha mụbaa bụ iheọma nke ụnụ na-akụ dịka mkpụrụ.
Ọ ga-emekwa ka ngọzi nke sitere n’ezi ọrụ ụnụ bawanye. Ọ ga-eme ka ụnụ bụrụ ọgaranya n’ụzọ ọbụla, nwee ihe e ji arụ ọrụ obiọma mgbe ọbụla.
Nke a ga-eme ka ọtụtụ mmadụ kelee Chineke n’ihi onyinye obiọma ụnụ nke ha na anata site n’aka anyị.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 112:1-2, 3-4, 9.
Azịza: Añụrị na-adịrị onye na-atụrụ Onyenweanyị egwu.
1. Alleluia, Añụrị na-adịrị onye na-atụrụ Onyenweanyị egwu,
onye ji ọñụ na-edebe iwu ya.
Ụmụ onye dị otu a ga-abụ ndị nwere ike n’ụwa,
agbụrụ onye ezigbo omume ga-enweta ngọzi.
Azịza: Añụrị na-adịrị onye na-atụrụ Onyenweanyị egwu.
2. Ezinụụlọ ya ga-enweta akụnụụba,
eziomume ya agaghị enwe mgbanwe
N’ihina Onyenweanyị ga-achawapụtara onye ezigbo omume
dịka ihe n’etiti ọchịchịrị.
ọ dị ebere na ịhụnaanya na-akwụba aka ọtọ.
Azịza: Añụrị na-adịrị onye na-atụrụ Onyenweanyị egwu.
3. Ọ naghị atụfu oge inyere ndị ogbenye aka,
eziomume ya anaghị agbanwe agbanwe,
ndị dị otu a na-enweta nsọpụrụ mgbe niile.
Azịza: Añụrị na-adịrị onye na-atụrụ Onyenweanyị egwu.
MBEKU – Ps. 19:9
Alleluia, Alleluịa:
Iwu nke Onyenweanyị na enye obi añụrị, ọ bụ ihe e ji ahụ ụzọ.
Alleluia.
OZIỌMA – 6:1-6
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Kpacharanụ anya ime eziomume, naanị ka ndị mmadụ wee hụ ụnụ, n’ihina ụnụ mee otu a, Nna ụnụ nke bi n’eluigwe agaghị akwụ ụnụ ụgwọ ọrụ.
Ya mere mgbe ọbụla ụnụ na enye onyinye, ụnụ afụla opi dịka ndị ihuabụọ si eme n’ụlọ nzukọ ha, na n’okporo ụzọ niile, ka ndị mmadụ wee too ha. N’ezie, agwa m ụnụ, ha anatala ụgwọ ọrụ ha.
Mgbe ọbụla ị na-enye onyinye ebere, ekwela ka akaekpe gị mata ihe akanri gị na-eme; ka o wee bụrụ ihe i nyere na nzuzo, Nna ụnụ nke na-ahụ na nzuzo ga-akwụghachi ụnụ ụgwọ.
“Mgbe ọbụla ụnụ na-ekpe ekpere, ụnụ emekwala ka ndị ihuabụọ, n’ihina ọ na-amasị ha ịkwụrụ ma na-ekpekwa ekpere n’ime ụlọ nzukọ na n’akụkụ okporo ụzọ niile, ka ndị mmadụ wee hụ ha.
N’ezie agwa m ụnụ, ha anatala ụgwọ ọrụ ha. Ma mgbe ọbụla ụnụ na-ekpe ekpere, banyenụ n’ime ụlọ ụnụ, mechie ụzọ, kpeere Nna ụnụ nke nọ na nzuzo. Nna ụnụ nke na-ahụ na nzuzo ga-akwụghachi ụnụ ụgwọ.
Igbo Mass Readings for June 19 2025, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for June 18 2025, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.